Full Lyrics
[SOLO]
Ọnwa eshie, Ọnwa n'eti nụ o
Jukuku ọma n'efesa mo
Kpakpando nk'igwe n'amuke
Nke a pụrụ iche nụ o
Ọnwa n'eti s'ike
Jukuku ọma n'efesa mo
Kpakpando nk'igwe n'amuke
Gịnị n'eme? Gịnị n'eme n'obodo?
Gịnị n'eme? Ndị be anyị gịnị n'afịọ nụ o?
[TUTTI]
A mụworo anyị Onye nzọpụta, Ọkpara Chineke
A mụworo anyị Onye o?
A mụworo anyị Onye nzọpụta, Onye bụ Messiah
Onye nzọpụta, n'ebe Kam g'ahụ Ya o?
A mụworo anyị Onye nzọpụta n'obodo Judea, e
A mụworo anyị Onye nzọpụta n'obodo Judea e
Ọ bụ Ya bụ Kristi? Ọkpara Chukwu?
Nwa ekwere na nkwa? Jesu Nwa Josefu?
Josefu, di Maria, e! Nwa Josefu?
Josefu, di Maria, e! Ọkpara Chineke?
Emmanuel, Chukwu nọnyere anyị
Kedu ihe anyị g'akpọ Ya nụ o?
Jesu Nwa David
Okpotokpo nwa ogaranya gadanga
Okpotokpo nwa ogaranya gadanga
Olor'enyi, Ony'ogbugbo, Onye isiyudo
Dike, dike, dike ndị kerere!
Dike ndị kerere!
[SECTION 2]
Gịnị k'anyị bịara ime?
Anyị bịara egwu ọnwa
Ihe ukwu mere n'obodo anyị
Gịnị k'anyị bịar'ime nụ o?
Anyị bịara n'amụta nwa anyị Onye nzọpụta
Kpakpangolo, Kpakpangolo
Udu mo, Ogene
Onye o mara suru ya
Suru ya, suru ya, suru ya!
Kụọrọ nụ nwa ngwere egwu
Nwa ngwere ejegh'ije n'ọgbar'ọsọ
Nwerente! Nwerente, nwerente, nwerente, ah!
Kpukpu mkpu ogene, Ogene, ogene
Onye n'akpụ ogene?
Anyị bịara egwu ọnwa
N'amụta nwa anyị Eze udo
Ọnwa eshie, Ihe ukwu emewo nụ o
Kpakpando nk'igwe n'ekel'Eze g'amụrụ ọhụrụ
Ọ bụ Ya bụ Kristi, Ọkpara Chukwu
[CODA]
Kpango tingo, Kpango tingo
Ko! Ko! Ko! Kororo!
Kororo, Onye n'anụ? Pụta n'iro
N'ọnwa eshie! Jesu abịago!
Jesu abịago! Ọnwa eshie
Dike k'amụta nwa anyị o
Dike ndị kerere
Kedu ihe anyị g'akpọ Ya nụ o?
Dike ndị kerere!