Full Lyrics
UKWE MBATA
Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị
Ịnụrị n'obe Dinwenụ anyị Jesu Kristi
Onye bụ nzọpụta ndụ na mbilite n'ọnwụ anyị
Ọ bụ na ya k'anyị si nweta nzọpụta na ntọhapụ
ABỤỌMA NA AZỊZA YA
Iko dị nsọ anyị gọziri b'oriri ọbara Kristi
VERSE 1
Ked' ihe m g'emere Dinwenu mak' ihe niile o megara m?
Aga m eburu iko nzọpụta wee kpọku aha Dinwenu
VERSE 2
Ọnwụ ndị kwere na Chukwu bụ ihe dị oké ọnụ Dinwenu nwodibo
Ka m bụ ị tọhapụla m n'agbụ
Ny' iny' ekele ke m n'enye aga m akpọku Dinwenu
Memeju nkwa m kwere Dinwenu n'ihu ndị nke ya niile
MBEKU
Dinwenu kwuru sị:
Iwu ọhụrụ ka m n'eny' unu
Ka unu hụọ n'anya
Otu m siri hụ unu