Full Lyrics
[REFRAIN]
Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru
Ka anyị jee n'ụlọ nke Chineke.
[VERSE 1]
Ugbu a anyị kwụzi n'ọnụ ụzọ ama Gị,
N'ọnụ ụzọ ama Gị, O Jerusalem.
[VERSE 2]
Arụrụ Jerusalem dị ka oke obodo
E jikọtara ọnụ nke ọma.
Ọ bụ na ya ka agbụrụ nile n'aga,
Agbụrụ nke Isrel.
Inye Onyenweanyị ekele,
Onyenweanyị dị ka O siri nye n'iwu.
Eb'ahụ ka e debere oche ikpe eziokwu,
Oche nke ụlọ David.
[VERSE 3]
N'ihi ụmụnna m na ndị enyi m,
Anam asị udo dịrị gị.
N'ihi ụlọ nke Onyenweanyị na Chineke nke anyị,
Anam arịọ mak'ọdịmma nke gị.