K' Anyi Gaa N'Ulo Onyenweanyi by Ugochukwu Martin — Lyrics

Ugochukwu Martin Igbo Entrance songs Psalms Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] K'anyị were ọñụ gaa n'ụlọ, n'ụlọ Onyenweanyị K'anyị were ọñụ gaa n'ụlọ Onyenweanyị [VERSE 1] Aṅụrịrị m ọñụ mgbe ndị ha kwuru sị K'anyị gaa n'ụlọ nke Onyenweanyị ugbua Jerusalem anyị kwụzị n'ọnụ ụzọ ama gị [VERSE 2] A rụrụ Jerusalem dị ka obodo Ejikọtara ọnụ, ejikọtara ọnụ nke ọma Ọ bụ na ya ka ebo niile naaga, agbụrụ nke Onyenweanyị [VERSE 3] Inye Onyenweanyị ekele Dị ka o siri nye n'iwu Ebe ahụ ka e debere oche ikpe, oche nke Ụlọ David [VERSE 4] Kpeenụ ekpere makụdo Jerusalem Ka ndị niile hụrụ gị n'anya nwee ọganihu Udo dịrị n'ime gị [VERSE 5] N'ihi ụmụnnam na ndị enyị m, anam asị udo dịrị gị N'ihi ụlọ nke Onyenweanyị na Chineke anyị Anam arịọ maka ọdịmma nke gị

Download the sheet music

K' Anyi Gaa N'Ulo Onyenweanyi

K' Anyi Gaa N'Ulo Onyenweanyi

By Ugochukwu Martin
Solfa
Igbo
2 pages
0 Downloads
Entrance songs Psalms
0 0

More lyrics you may want