En'igwe by Charles Onwubuya — Lyrics

Charles Onwubuya Igbo English Entrance songs Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

[RECITATIVE TENOR] Ololo, ụmụ nne m oge nk'anyị g'eji wee jee bee Chukwu elugo, K'anyị jee nụ, k'anyị jee kene Olisa bi n'igwe, K'anyị jee nụ, k'anyị jee kene Oloro ihe loro ihe tor'enyi ị ka n'eche kunie o [TENOR SOLO] K'anyị jee nụ k'anyị jee nụ lo Chukwu Kene ya n'ifeọma o mel'anyị diru Nwanne m bịa, nwanne m bịa, nwanne m bịa oh [CHORUS] K'anyị jee oh! K'anyị jee too ya n'ọrụrụ ya K'anyị jee nụ, k'anyị jee too ya n'ebube En'igwe N'ụwa naama jijiji n'ike ya ewo! K'anyị jee zukọ nụ na Jerusalem K'anyị jee nụ, k'anyị jee too ya n'ọrụrụ ya ụmụ nne m K'anyị jee nụ, k'anyị jee too ya n'ebube En'igwe N'ụwa naama jijiji n'ike ya ewo! K'anyị jee zukọ na Jerusalem [VERSE 1] Añụrịrị m ọñụ mgbe a naasị K'anyị jee n'ụlọ nke Chukwu, Ukwu anyị guzo n'ihu gị na Jerusalem. Añụrịrị m ọñụ mgbe a naasị K'anyị jee n'ụlọ nke Chukwu, Ukwu anyị guzo n'ihu gị na Jerusalem. [VERSE 2] Jiri mkpu ọñụ nwanne m bịa n'ihu ya mara na ị dị mma Ya ba l'ụba oh [SOPRANO / TENOR SOLO] Agam ewer'obim jere Chim ozi Woro ya ọrụ ọma oh kunie Zipụ nụ ozi ọma oh! [CODA] K'anyị jee oh! Anyị niine g'aba En'igwe Nwa Chineke ka m bụ n'ụwa gaagbalịlị ọkụ Amen. Nwa Chineke ka m bụ n'ụwa gaagbalịlị ọsọ Amen. Nwa Chineke ka m bụ n'ụwa mmeri gaabụ nk'anyị Amen. Nwa Chineke ka m bụ n'ụwa I see oh! see e Nwa Chineke ka m bụ n'ụwa ifeọma g'adịrị gị Ifeọma oh! Ifeọma, ifeọma oh! Ifeọma oh Ifeọma g'adịrị anyị, ifeọma g'adịrị gị Ifeọma g'adịrị anyị, ifeọma g'adịrị anyị oh Ifeọma nke En'igwe

Download the sheet music

En'igwe

En'igwe

By Charles Onwubuya
Solfa
Igbo, English
5 pages
11 Downloads
Entrance songs Celebrations
0 0

More lyrics you may want