Full Lyrics
Ihe isi ike, ọ karịala! Ewo;
Agụụ ụwa, ọ ti nwata n'ihunne ya
Ọ gịnị k'anyị g'eme o!
Chineke zọbanyị ma ọ bụ gịnị
Ka na onye agụụ naagụ n'ewe iwe okungwangwa.
Ọ bụrụ mgbe anyị nọ n'agha,
Ọ jara kwa ngwomume maka n'ebere Chukwu g'ebutugo n'edu anyị
Dị k'ọ siri mee mgbe anyị lụrụ agha Biafra,
Afọ atọ gharị nwụchasi
Ọ bụ naanị agụụ k'a naarịa? Mba,
Ajọ ọrịa sokwa n'ime ya.
Ndị anyị naarịa, ị na ndị anyị naarịa gharịa na mbụ
Nke otu n'ime ha mbụ, bụ nejie obiri n'ajọcha.
Iche na agụụ sigo? Ewo Chimo!
Aga m enye gị azụ maka na asị m onye a gaakọdụgle
Ọnwụ a kpadọghị agbarole?
Ọnwụ ike, ọnwụ a ke akari go! Kwado.
Ọnwụ arịaghị arịa nwụọ
Ọnwụ a gberede
Jụre be niile. Kedụ nsị ya
Ụmụaka agwụla nụ, Iya!
Okenye nanwụ, ikolo nanwụ, agbọghọ nanwụ eeh!
Kedụ nsị ya eeh!
Ụmụnne m, anyị tọratọ!
Wetuo obi ịnụgo, ego ọ naagwụ agwụ,
Ewo chetakwa elụ ụwa bụ olili
Biko ụmụ ụwa, ego ụwa ọ naagwụ agwụ?
Ewo chetakwa elụ ụwa bụ olili.
Ụmụ ụwa jiri nwayọ k'ofe rọrọrọ zuo anyị nri,
Ewo chetakwa, elụ ụwa bụ olili.
Ihe n'eme anyị sikwa anyị n'aka nwa nne mo,
Anyị akpọtugo: iwe Chineke sile
O, tarabadam, pamparam param.
O, tarabadam, O, tarabadam, tururum,
Tidibedi teerem, teerem, tururum, tururum,
N'ọmụma anyị; Anyị kpatara nkyahụhụ
Ngwere pụrabadam, pamparam param.
Tururum, tidibedi teerem.
Kedi kwanụ maka ndị ke g'echi
Ewo, ụmụ ụwa doo.
Ha ahinye l'anyi aju n'anya, b'achinye l'anyi osiado
Ndị nọ n'isi n'azọ akpa ha, ndị nọ n'ọdụ n'azọ akpa ha.
Ndị ọgaranya n'eriju afọ, ụmụ ogbenye n'ahụju anya
O Nigeria chegharịa ihe gaadịrị anyị mma,
Ọ bụrụ n'anyị g'echeta Chukwu ee!
Ọ bụrụ n'anyị nụta ziakwu ihe g'adịrị anyị mma.
K'anyị cheta n'ego bụ mgborogwụ njọ doo.
Sọpụrụ isiawo, ndị be anyị o,
K'anyị cheta n'ọghịchi si n'aka Chukwu were bịa,
Akwụkwọ nsọ kwuru n'ị hụ mmadụ ibe gị n'anya k'isi hụ onwe gị,
K'anyị hụrịta onwe anyị n'anya, ụmụnne m maka Chukwu, ewo!
Biko ụmụnne m ụnụ anụgo,
Chegharịa nụ o ụmụnne m, ihe g'adị mma,
O Nigeria chegharịa, ihe gaadịrị anyị mma.