CHINEKE, ODOGWU! by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Hymns Anthems Concert Non-Liturgical / Special Choir Arrangements Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Chukwu onye kacha mma Onye k'anyị g'eji tunyere Gị Onye dị ka Gị Nna gọzie Okike kacha mma [TUTTI] Kwerenụ Dinwenụ ukwe ọhụrụ Kwerenụ Dinwenụ Chineke ukwe ọhụrụ Kwerenụ Dinwenụ Chineke ukwe ọhụrụ wepụt' olu Gị Aha ya dị nsọ Wepụt' olu Gị kwebie n'ọnụ Gị Ọrụ ọma ee naagọzi Nụrebanụ na Chineke anyị bụ Odogwu! Chineke anyị bụ Odogwu! N'ọ bụ Odogwu n'agha Aha ya Odogwu n'agha Kọwapụta ebube ya na mba niile Kwupụta ihe ọma nke nzọpụta ya Ebube ya n'obodo niile Ozi ọma nke nzọpụta Na mba niile ụbọchị niile Gwanụ mba niile taa mba obodo niile Na Chukwu bụ ike ebube Chineke Oge niile ụbọchị niile Saanụ fififi bititi Chineke bụ Ọchịagha Anyị g'atụ egwu, Kachacha Chineke Chineke n'igwe n'ala Sọ Gị bụ Chineke Chi ka Chineke Chukwu okike, Okike Gị g'erubere Gị isi Ihe niile dị n'ụwa ha bụ ọrụ aka Gị Ọnwa na kpakpando sokwa n'ọrụ aka Gị Anyanwụ naalịkụ, Ọ bụ onye kere ha? Egbe eluigwe y'awagamram ọrụ aka Gị Azụ ka na mmiri ha bụ nke Gị Anụmanụ bi n'ọhịa nke Gị ka ha bụ Chineke nke igwe n'ala, Chineke m o Chukwu ọma dị mma Chineke Nna nke igwe n'ala Chineke bụ dike! K'anyị jaa ya mma Ọ bụ Odogwu! Ebe ụwa g'asọpụrụ Aha ya Ebube Dike! Ngọzi naadịrị Chineke Ọkaka Nna, k'anyị jaa ya mma Chineke bụ Ekwueme Anyị g'ajaa ya mma [SOPRANO SOLO] Bịanụ k'anyị jaa ya mma K'anyị bunye y'otito K'anyị nye Chineke ekele Eze dị mma k'anyị jaa ya mma Ụmụ mmadụ dụ ndị bi n'ụwa Bụkọ kelenụ Chineke Chukwu bunye y'otito Chineke Nna nke eluigwe Ọ mara mma k'anyị jaa ya mma Ọ bụ ya kere Gị jaa ya mma Ọ naechekwaba Gị bunye y'otito maka n'ọ dị mma Ngwanụ k'anyị nye Chineke Nna ekele nke kwesịrị ya, jaa ya mma Abụ ukwe k'anyị jiri bịa k'anyị jaa ya mma, abụ dị ụtọ naadị Gị mma, Onye Nsọ O! Chineke dị mma Agam ekwupụta otito Gị n'ịdị mma, Chineke ke n'ụwa, ware bunye Gị otito Chineke dị mma Chineke jaa Gị mma Ekele Eze dị mma k'anyị jaa ya mma [GLORIA PATRI] Otito dịrị Nna, dịrị Nwa, Otito dịrị Mmụọ Otito dịrị Nna ya na Nwa ee Otito dịrị Mmụọ Otito, Otito, Otito, Otito dịrị Nsọ Ebuodi n'izizi O g'adị gide Atọ n'otu Ebuodi na mbụ, o g'adị gide Ruo mgbe ebigh'ebi ebuodi n'izizi Mgbe niile ebigh'ebi ebigh'ebi ebuodi n'izizi O g'adị gide ruo mgbe ebigh'ebi O g'adị gide ruo mgbe niile mgbe ebigh'ebi, Amen O g'adị gide ebigh'ebi ebigh'ebi ebigh'ebi Amen [CODA] Chineke bụ Dike! K'anyị jaa ya mma! Ọ bụ Odogwu! El'uwa gh' sopur' Aha ya Ngọzi n'adịrị Chineke Ebube Dike! Ngọzi n'adịrị Chineke Ọkaka, K'anyị jaa ya mma Chineke bụ Ekwueme Chukwu K'anyị jaa ya mma Ọkaka Nna, K'anyị jaa ya mma Anyị g'ajaa ya mma Ihe anyị Chukwu, El'uwa gh' sopur' Aha ya Ngọzi n'adịrị Chineke Nna, Chukwu K'anyị jaa ya mma

Download the sheet music

CHINEKE, ODOGWU!

CHINEKE, ODOGWU!

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
6 pages
0 Downloads
Hymns Anthems Concert Non-Liturgical / Special Choir Arrangements
0 0

More lyrics you may want