Full Lyrics
CHORUS
Doo Nna! Nar'onyiny'anyi jiri bịa n'iru Gị.
Onyinye mara mma, onyiny'obi ọcha. Chinaka,
nar'onyiny'anyi jiri bịa gọzie ha, ma gọzie anyị nile.
VERSE 1
Chinaka, ọ bụ Gị bụ Chukwu okike.
Okike nile, Chinaka, si n'aka Gị.
Ị gwara m na ihe n'eme
REFRAIN
n'el'ụwa k'osi masị Gị,
Nna, ihe n'eme ka Eke ker'ụwa si chọọ!
Ihe n'eme n'el'ụwa k'osi masị Gị,
Nna, ihe n'eme ka Eke ker'ụwa si chọọ!
VERSE 2
Okwu Gị n'atasị m'obi n'ime ndụ m o.
Mgb'ọchịchị gbara na ndụ m o, Okwu Gị bụ ihe m o!
Ị gwara m na ihe n'eme
VERSE 3
Atụkwasara m Gị obi, Chinaka m o!
Onwegh'ihe gbara Gị gharịị n'ime ndụ m o!
Ị gwara m na ihe n'eme
VERSE 4
Aga m anat'añụrị n'aka Gị, ezi Chi m'ọma!
Aga m anat'ahụhụ n'aka Gị.
Ị gwara m na ihe n'eme
VERSE 5
Ị sị m'atụ n'egwu n'ime nsogbu, n'Ị nọ ya.
Ị sị m kpaba nganga n'ime Gị, n'im'añụrị!
N'ihi na ihe n'eme