Full Lyrics
[Intro: Baritone Solo]
N̄ụrịa nụ ọṅụ kwebe n'ukwe gbaba n'egwu
Maka na ihe ukwu emeela
Maka na ngịngịe jiela
Amụrụ eze ụwa niile
Amụrụ nwa ka nwa
Amụrụ Emmanuel Chukwunọnyereanyị
[Acappella]
Ụmụnne m n̄ụrịanụ ọṅụ gbaba n'egwu
Kwenụ ukwe n'ihi na amụrụ nwa ka nwa
N̄ụrịanụ ọṅụ nweba an̄ụrị
Kwenụ ukwe n'ihi na amụrụ Emmanuel
Butenụ egwu ọṅụ egwu dị mma
Kwebenụ bute egwu ọṅụ egwu dị mma biko kwebe
Kwe naada ụda kwesie ya ike
Kwebe kwebe kwebe kwebe kwebe kwebe
Kwebenụ ukwe dị mma k'anyị jee n'ụlọ anụ
Ebe amụrụ ya ngwanụ k'anyị jee
Jebe na Bethlehem ngwanụ k'anyị jeebe
Jebe n'ụlọ anụ ebe amụrụ Jesu
Jesu nwa ka nwa ngwanụ
Jesu nwa ka nwa eze ụwa dum
Eze ị bịaruola eze ụwa nnọọ
Nwa ka nwa odogwu akataka doo oh nnọọ
Ụwa dum eze ị bịaruola mehee obi gị nabata
Nwa ọhụrụ e nyere anyị Jesu anyị naasị gị
[Soprano or Tenor Solo]
Oh Jesu nnọọ ị bịala
Jesu nnọọ ị bịala
Jesu nwa Chukwu nnọọ n'ụwa
O tego aka ndị amụma jiri ziwe anyị ozi
Na a gaamụrụ anyị otu nwa onye nzọpụta
Ọchịchị gaabụ nke ya ọ gaachị eze
N'igwe n'ụwa chịruo n'ala mmụọ
Ọ gaachị oh eze nnọọ ị bịala
Ọ bụ ihe omimi na Chukwu nwasi n'igwe wee bụrụ mmadụ
[Refrain]
Ị hụla ihe omimi na Chukwu bụrụ mmadụ
Ị hụla ihe omimi na Chukwu bụrụ mmadụ
Ya na Chukwu bụrụ mmadụ nkịtị
Mmadụ mejoro Chukwu
Chukwu achọba etu ọ gaesi wee mezie agbata dị na mmadụ na Chukwu
Ị hụla nwa ọhụrụ na ọ bụ n'ime ụlọ
Eze ụwa dum yiri eze ụwa dum
Ha gaenye eze amụrụ
Ị hụla ihe omimi na Chukwu bụrụ mmadụ
Ị hụla ihe omimi na Chukwu bụrụ mmadụ ngwanụ
Nwebanụ an̄ụrị ah soro m kwebe n'ukwe ah
Ndị mmụọ ozi naegoli ngwanụ
Soro ndị mmụọ ozi naekwe
[Chorus]
Otito dịrị Chineke
Otito dịrị Chineke n'elu kacha elu n'ụwa
Udo dịrị ndị nwere obi ọma
Otito dịrị Chineke n'elu kacha elu n'ụwa
Udo dịrị ndị nwere obi ọma
[Acappella]
Kristi abịago Kristi abịago Kristi abịago
Kristi abịago Kristi abịago Kristi abịago
[Tenor Solo]
Ngwanụ rịba n'ọn̄ụ kwebenụ
Ukwe gbaba n'egwu n'ihi na amụrụ Emmanuel
Chukwunọnyereanyị