Full Lyrics
INTRO
Turuyum pararam
Tururum hmm hmm
Pararam
VERSE 1
Ekwensu n'agba okembo k'o duhie ụmụ Chineke
Ụwa Chukwu kere tinye anyị na mbu, ụwa bụrụ sọ mma
Anya ukwu wee jide ụwa wee tinye ya katakata
Chukwu biko ghara Nna, anyị emehiego
CHORUS
Akụ ụwa, ego ụwa, ihe ụwa
Ụtọ ụwa, ije ụwa, elu ụwa
Naanị nwa oge nta
Akụ ụwa, n'ego ụwa, n'ihe ụwa
N'ụtọ ụwa, m'ije ụwa, n'elu ụwa
Bụ alaba aghara
VERSE 2
Oke ọchịchọ na anyaụfụ n'eti s'ụmụ Chineke
Ụwa Chukwu kere tinye anyị na mbu, ụwa ịhụnanya
Anyaụfụ wee jide ụwa wee kunye ya yagayaga
Chukwu biko ghara Nna, anyị emehiego
VERSE 3
Ikwikwii na njọ mmetọ ebibiela ụwa
Ụwa Chukwu kere tinye anyị na mbu, ụwa samasamasama
Nwa nke mmadụ wee jide ụwa wee nyachaa ya potopoto
Chukwu biko ghara Nna, anyị emehiego
PREAMBLE (Optional)
Nezie, ọ gaara akaara m mma ma asịkwa na m anwụọlarị
N'ihi na ihe m naahụzị n'elu ụwa taa naemezim echeta ebewe.
Lekene ụwa Chineke kechara chọọ mma, wee were ya nyefee anyị n'aka.
Ya ka nwa nke mmadụ jidere wee were njọ wee nyaa ya poti.
Lezienụ ka ọnwụ siri naegbuzi ka atụrụ aka.
Mmiri agbarụsịchaala.
Ọ bụ ezie na igwe nile jeko n'ụzụ, mana nke ahụ anaghị amapụm obi.
Naanị ihe naamapụm obi bụ na ọbụrụ na achọọm n'ụwa taa ma ahụghị m,
Kedu ebe mkpụrụ obim gaanọ?
Ọ bụ n'elu igwe ka ọ bụ n'ọkụ ala mmụọ?
Chineke biko gbataram ọsọ enyemaka na mmiri eriem.