UWA - ALABA AGHARA by Okeke Paschal — Lyrics

Okeke Paschal Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer Lenten Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Turuyum pararam Tururum hmm hmm Pararam VERSE 1 Ekwensu n'agba okembo k'o duhie ụmụ Chineke Ụwa Chukwu kere tinye anyị na mbu, ụwa bụrụ sọ mma Anya ukwu wee jide ụwa wee tinye ya katakata Chukwu biko ghara Nna, anyị emehiego CHORUS Akụ ụwa, ego ụwa, ihe ụwa Ụtọ ụwa, ije ụwa, elu ụwa Naanị nwa oge nta Akụ ụwa, n'ego ụwa, n'ihe ụwa N'ụtọ ụwa, m'ije ụwa, n'elu ụwa Bụ alaba aghara VERSE 2 Oke ọchịchọ na anyaụfụ n'eti s'ụmụ Chineke Ụwa Chukwu kere tinye anyị na mbu, ụwa ịhụnanya Anyaụfụ wee jide ụwa wee kunye ya yagayaga Chukwu biko ghara Nna, anyị emehiego VERSE 3 Ikwikwii na njọ mmetọ ebibiela ụwa Ụwa Chukwu kere tinye anyị na mbu, ụwa samasamasama Nwa nke mmadụ wee jide ụwa wee nyachaa ya potopoto Chukwu biko ghara Nna, anyị emehiego PREAMBLE (Optional) Nezie, ọ gaara akaara m mma ma asịkwa na m anwụọlarị N'ihi na ihe m naahụzị n'elu ụwa taa naemezim echeta ebewe. Lekene ụwa Chineke kechara chọọ mma, wee were ya nyefee anyị n'aka. Ya ka nwa nke mmadụ jidere wee were njọ wee nyaa ya poti. Lezienụ ka ọnwụ siri naegbuzi ka atụrụ aka. Mmiri agbarụsịchaala. Ọ bụ ezie na igwe nile jeko n'ụzụ, mana nke ahụ anaghị amapụm obi. Naanị ihe naamapụm obi bụ na ọbụrụ na achọọm n'ụwa taa ma ahụghị m, Kedu ebe mkpụrụ obim gaanọ? Ọ bụ n'elu igwe ka ọ bụ n'ọkụ ala mmụọ? Chineke biko gbataram ọsọ enyemaka na mmiri eriem.

Download the sheet music

UWA - ALABA AGHARA

UWA - ALABA AGHARA

By Okeke Paschal
Solfa
Igbo
3 pages
2 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer Lenten Hymns
0 0

More lyrics you may want