Full Lyrics
INTRO
Ked' ihem g'enye Gị Chineke ọma nma zur'ahụ
Ked' ihem ga emere Chineke Odogwu n'agha
Ọbụ onye g'akachasị mere Chineke Odogwu n'agha
Is'iyi nkendụ m o Agadagbachiriụzọ
Chukwu nkenk'iyi n'ebu ogwe, abụ ọma kanyi ji bịa n'iru Gị Chineke!
Abụ otito kanyi ji bịa ezi Chukwu
TUTTI
Soro m n'eto Ya n'eto Ya n'ọdịnmma
Soro m n'eto Ya n'eto Ya n'ọdịnmma
Chineke m o Eze, ya n'ọdịnmma ndị nke Chineke bịanụ
Agam akọr'ụnụ ebube n'ịdịnmma Agam akọ
Ihe Chukwu mere m o n'ọdị egwu, ịhụnanya Chineke karịcha
Ihe Chukwu mere m o ewo ịhụnanya Chukwu
Cha mgbe nịlem ekuru Gị Ị n'aza m eleg'anya n'ala
Ọ n'aza m o eleg'anya n'ala
Ọ n'aza m o eleg'anya n'ala
Ọ n'alu ọlụ ebube
Izu n'ime mkpa m kam bekuru Gị Okw'izara m o Chineke Onye d'izu
Mgbe m kpokuru Gị Okw'izara m o Chineke Onye dịka Gị
O abụ otito kam g'eji wee kele Gị Chukwu Nna
O abụ otito kam g'eji ekele Gị
O abụ otito kam g'eji jaa Gị nma O Chineke
O abụ otito kam g'eji jaa Gị nma Chineke
O abụ otito kam g'eji wee jaa wa Chineke nma
Chineke n'ịdị nma ebube Gị dị ukwu
VERSE 1
Agam eji ịjụ wee kpọrọ Chineke m egwu wee kelee Ya n'ih'ọma o meere m
Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ
Agam eji ube wee kpọrọ Chineke m egwu la kelee Ya n'ih'ọma o meere m
Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ
Ihe o meere m o leekwanụ m o Bịanụ kanyi too Ya Nwannem
Ngozi o nyere m o Amara o nyere m o Ngozi Ya bara ụba Amara Ya dị ka ok'osimiri
VERSE 2
Agam eji ịjụ ne wee kelee Dinwenu maka ih'ọm'e mer'anyi
Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ
Agam eji ụbọ wee kpọrọ Chineke m egwu aze kelee Ya n'ih'ọma o meere m
Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ
Ihe o meere m o leekwanụ m o Bịanụ kanyi too Ya Ewo Chineke m o
Ihe o meere m kọwa kọwa kọwa kọwa kọwa nmeso ọma Chineke