Som Too Chukwu by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Recessional / Dismissal Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Ked' ihem g'enye Gị Chineke ọma nma zur'ahụ Ked' ihem ga emere Chineke Odogwu n'agha Ọbụ onye g'akachasị mere Chineke Odogwu n'agha Is'iyi nkendụ m o Agadagbachiriụzọ Chukwu nkenk'iyi n'ebu ogwe, abụ ọma kanyi ji bịa n'iru Gị Chineke! Abụ otito kanyi ji bịa ezi Chukwu TUTTI Soro m n'eto Ya n'eto Ya n'ọdịnmma Soro m n'eto Ya n'eto Ya n'ọdịnmma Chineke m o Eze, ya n'ọdịnmma ndị nke Chineke bịanụ Agam akọr'ụnụ ebube n'ịdịnmma Agam akọ Ihe Chukwu mere m o n'ọdị egwu, ịhụnanya Chineke karịcha Ihe Chukwu mere m o ewo ịhụnanya Chukwu Cha mgbe nịlem ekuru Gị Ị n'aza m eleg'anya n'ala Ọ n'aza m o eleg'anya n'ala Ọ n'aza m o eleg'anya n'ala Ọ n'alu ọlụ ebube Izu n'ime mkpa m kam bekuru Gị Okw'izara m o Chineke Onye d'izu Mgbe m kpokuru Gị Okw'izara m o Chineke Onye dịka Gị O abụ otito kam g'eji wee kele Gị Chukwu Nna O abụ otito kam g'eji ekele Gị O abụ otito kam g'eji jaa Gị nma O Chineke O abụ otito kam g'eji jaa Gị nma Chineke O abụ otito kam g'eji wee jaa wa Chineke nma Chineke n'ịdị nma ebube Gị dị ukwu VERSE 1 Agam eji ịjụ wee kpọrọ Chineke m egwu wee kelee Ya n'ih'ọma o meere m Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ Agam eji ube wee kpọrọ Chineke m egwu la kelee Ya n'ih'ọma o meere m Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ Ihe o meere m o leekwanụ m o Bịanụ kanyi too Ya Nwannem Ngozi o nyere m o Amara o nyere m o Ngozi Ya bara ụba Amara Ya dị ka ok'osimiri VERSE 2 Agam eji ịjụ ne wee kelee Dinwenu maka ih'ọm'e mer'anyi Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ Agam eji ụbọ wee kpọrọ Chineke m egwu aze kelee Ya n'ih'ọma o meere m Agam eji olu m bụọrọ Y'abụ d'ụtọ Ihe o meere m o leekwanụ m o Bịanụ kanyi too Ya Ewo Chineke m o Ihe o meere m kọwa kọwa kọwa kọwa kọwa nmeso ọma Chineke

Download the sheet music

Som Too Chukwu

Som Too Chukwu

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
29 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations Recessional / Dismissal Hymns
0 0

More lyrics you may want