Full Lyrics
REFRAIN
Sọ otu ihe kam naarịọ n'aka Dinwenu
Kam biri n'ụlọ nke Dinwenu na mbọsị ndụm nile
VERSE 1
Dinwenu bu ihe na nzọpụta m
Onye kam g'atụ egwu
Dinwenu bu ebe mgbaba m
Onye g'eyi m egwu
VERSE 2
Ọ g'ezo bem n'ime mkpụkpụ ya
Kwudo sie m ike na nkume
Ọ g'ezo bem eb'obibi ya
Mbọsị ọ gbaghara
VERSE 3
Agam ewere ọbiañụrị
N'achụ aja n'ụlọ Dinwenu
Agam ekwe ukwe añụrị
Nye Dinwenu
VERSE 4
Otito dịrị Nna na Nwa
Na Mmụọ nsọ
N'ụwa tụwa nile