NDIDI (A SONG OF REASSURANCE) by Chris N. Ogu — Lyrics

Chris N. Ogu Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer Solfa notation

Full Lyrics

SOPRANO INTRO Ọ dị mma o, ọ dị njọ o, Ọtụ ahụ l'obiri dị n'igwe, Nwannem tinyese y'obi ọma, Nwe obi n'ndidi, Chukwu emesia o ihe ya dị mma. CHORUS Ọ dị mma o, Nụrụ ọ na'mma ọ dịrị gị mma, Sịrị dịrị gị, dịrị gị nwannem, bi t'o tinyese y'obi ọma, Ma dibe o, dibe o, tụkwasị obi nụ Chukwu, dibe o, Nwannem, emesia o ihe ya n'dị mma. VERSE 1 Obodo ajọka zị njọ o, Ihe si gbu onwe ya n'ike, Mmadụ n'chọ ịgbaba ọhịa n'ihi ahụhụ ụwa o, Otego anyị ji nwebe olile anya, Ma buru n'obi n'otu ụbọchị, A g'enwe mgbanwe o. Nwannem... VERSE 2 Ụfọdụ e gbuwo madụ ibe ha iji kpat'ego, Ụfọdụ egbuwo wayo e iji kpat'ego, Ụfọdụ anfuwo ebe ha n'achụ ego, Ma cheta n'ụba n'eny'aṅụrị bụ sọ nke si n'aka Chukwu bịa, Sọ nke si n'aka Chukwu bịa. Nwannem... VERSE 3 Pụta, pụta, Pụtakene, pụtakene, Pụta, pụta, pụta, Onye ji l'ụwa eme ọnụ n'ụwa n'eme ntu, Onye me n'ọnụ n'ụwa n'eme ntu, N'ụwa n'eme ntu, O kelee Chi ya. Nwannem...

Download the sheet music

NDIDI (A SONG OF REASSURANCE)

NDIDI (A SONG OF REASSURANCE)

By Chris N. Ogu
Solfa
Igbo
2 pages
7 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want