Full Lyrics
SOPRANO INTRO
Ọ dị mma o, ọ dị njọ o,
Ọtụ ahụ l'obiri dị n'igwe,
Nwannem tinyese y'obi ọma,
Nwe obi n'ndidi,
Chukwu emesia o ihe ya dị mma.
CHORUS
Ọ dị mma o,
Nụrụ ọ na'mma ọ dịrị gị mma,
Sịrị dịrị gị, dịrị gị nwannem, bi t'o tinyese y'obi ọma,
Ma dibe o, dibe o, tụkwasị obi nụ Chukwu, dibe o,
Nwannem, emesia o ihe ya n'dị mma.
VERSE 1
Obodo ajọka zị njọ o,
Ihe si gbu onwe ya n'ike,
Mmadụ n'chọ ịgbaba ọhịa n'ihi ahụhụ ụwa o,
Otego anyị ji nwebe olile anya,
Ma buru n'obi n'otu ụbọchị,
A g'enwe mgbanwe o.
Nwannem...
VERSE 2
Ụfọdụ e gbuwo madụ ibe ha iji kpat'ego,
Ụfọdụ egbuwo wayo e iji kpat'ego,
Ụfọdụ anfuwo ebe ha n'achụ ego,
Ma cheta n'ụba n'eny'aṅụrị bụ sọ nke si n'aka Chukwu bịa,
Sọ nke si n'aka Chukwu bịa.
Nwannem...
VERSE 3
Pụta, pụta,
Pụtakene, pụtakene,
Pụta, pụta, pụta,
Onye ji l'ụwa eme ọnụ n'ụwa n'eme ntu,
Onye me n'ọnụ n'ụwa n'eme ntu,
N'ụwa n'eme ntu,
O kelee Chi ya.
Nwannem...