Oru itunanya by Fabian Anagwu — Lyrics

Fabian Anagwu Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Leenu ọrụ ịtụnanya, Leenu ọrụ ịtụnanya. [REFRAIN] Leenu ọrụ ịtụnanya, ọrụ ọma dị ebube, Leenu ọrụ ịtụnanya Chineke naarụrụ ụmụ mmadụ. Leenu anya ka ị hụ ngọzi Chukwu n'ime ndụ gị, Leenu anya ka ị hụ amara Chukwu n'isi mmadụ bịa kele ya. Wer' aṅụrị buteere ya onyinye dimma ruuru ya n'ọ bụ Chukwu. [VERSE 1] Ebube Chineke, ọrụ dimma amara, Ihe nile ị nwere bụ onyinye Chukwu, ya n'azụ gị nwanne m, Ma ndụ ị dị si n'aka Chineke, gịnị k'ị g'eji kele ya? [VERSE 2] Ebube Chineke, ọrụ dimma amara, Mgbe anyị n'agagharị, ebube Chineke n'echekw'anyị, Ọpụpụ na mbata anyị nile dị n'aka Chineke kelenu ya. [VERSE 3] Ebube Chineke, ọrụ dimma amara, Chetakwa n'ọ bụ Chukwu n'enye mmiri n'oge nke ya, Ma anyanwụ ị hụzụ ọrụ ịtụnanya Chineke n'arụrụ ụmụ mmadụ kelenu ya.

Download the sheet music

Oru itunanya

Oru itunanya

By Fabian Anagwu
Solfa
Igbo
3 pages
0 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want