Full Lyrics
REFRAIN
Onye bụ eze nke ebube?
Onye bụ eze nke ebube?
Ọ bụ onye nwe anyị,
Ọ bụ onye nwe anyị.
VERSE 1
Nabatanụ ya,
Mehee obi gị nwanne m ka ọ bata.
Kwadooro ya ọnọdụ na ndụ gị n'ihi n'ọ bụ onye kere gị.
Ọnụzọ okpu litenu elu,
Ọnụzọ okpu litenu elu,
Litenu, litenu, litenu elu ka eze d'ebube wee bata.
VERSE 2
Onye bụ eze ebube a?
Onye nwe anyị, onyekwa bụ ez'ebube?
Dike, Dike,
Onye nwe anyị bụ Dike ọgụ n'agha.
VERSE 3
Onye bụ eze ebube a?
Onye bụ eze karịa Dinwenu nk'igwe ndị agha?
Ọ bụ ya bụ eze ebube.
Dinwenu nk'igwe ndị agha,
Ọ bụ ya bụ ez'ebube.