Full Lyrics
Onye bụ eze nke ebube,
Onye bụ eze nke ebube,
Onye bụ eze nke ebube,
Ọ bụ onye nw'anyị.
Nabatenu ya,
Mehe obi gị nwanne m ka ọ bata,
N'ihi n'ọ bụ onye kere gị.
Ọnụzọ ama bulienụ isi unu elu,
Ọnụzọ okpu litenụ elu,
Lite, lite, litenụ ka eze di ebube wee bata.
Onye bụ eze ebube a?
Onye nwe anyị,
Onye kwa bụ Eze ebube.
Dimkpa, Dike, Dike,
Onye nw'anyị bụ Dike ọgụ n'agha.
Onye bụ eze ebube a?
Dinwenu nk'igwe ndị agha,
Ọ bụ ya bụ eze ebube.
Dinwenu nk'igwe ndị agha,
Ọ bụ ya bụ eze ebube.