Full Lyrics
[CHORUS]
Ewo akwa arịrị
Ọnwụ bụ mgbanwe
Onye anyị hụrụ n'anya
Ọnwụ dị mma
Nke dị mma maka na ọnwụ bụ mgbanwe
Gaa zuru ike na be Nna gị
Oge ezu go
[VERSE 1]
Gị nwa mmadụ ichezọgọ
N'ụwa anyị bịara bụ ahịa
Ichezọgọ lee nụ
Nwanne anyị ka ọ tọgbọ n'ozu
Otu ụbọchị
G'abụkwa nke gị
Aka k'anyị gbate, bịanụ we aka k'anyị
Gaba laa ma oge ruo
Mmadụ bụ aja, mmadụ bụ ntụ ahụ
[VERSE 2]
Ọnwụ
Ọnwụ dị egwu
Buru ọgbalaga
Kwụgbu go nwanne
Obe akwa ebezina
Onye n'eru uju eruzina
Onye nwụrụ n'ime Kristi gaesoro ya kulie
Mmadụ bụ aja, mmadụ bụ ntụ ahụ
[VERSE 3]
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Gwanụ m onye ma ihe echi g'abụ
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Ọ ma ụbọchị nke gị
Kwo ebe niile
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Ọ ma ụbọchị nke gị
Onye ị hụrụ taa ị gaghị ahụ ya echi
Abụ m nke a, abụ m nke ọzọ
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Gwanụ m ọnwụ dị nso
Chetekwa n'ụwa bụ ahịa
Gwanụ m ọnwụ dị nso
Ị gbusie mmadụ n'elu ụwa
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Ọ ma ụbọchị nke gị
Matakwa n'ị gaanwụrịrị
Gwanụ m ọgwọ ọgwụ g'esi n'ọgwụ laa o
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Ọ ma ụbọchị nke gị
Ome mma n'emere onwe ya nwanne m
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Ọ ma ụbọchị nke gị
Ome njọ n'emere onwe ya nwanne m
Gwanụ m ọnwụ dị egwu
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Ọ ma ụbọchị nke gị
Gwanụ m ọnwụ dị egwu
Onye ma ụbọchị ọ g'abụ nke ya nwanne m
Ọ ma ụbọchị nke gị