Omaricha-chukwu by Chidi Ezigwe — Lyrics

Chidi Ezigwe Igbo Offertory Hymns Folk songs Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Bụkọtanụ ih'onyinye, onyinye dị mma K'anyị jee kele Chukwu mara mma, nwannem K'anyị jee kele Ọmarịcha Chukwu, Ọmarịcha Chineke n'ebe ya dị nsọ. K'anyị tibenu egwu, k'anyị gbabanụ egwu, Egwu egwu ọma o gbabanụ egwu ọma Kokotitiko ti egwu añụrị, Egwu ngala o egwu oyoko, Egwu oyorima k'anyị jeenụ nye Chinek' onyinye o. VERSE 1 Ụmụ mmadụ k'anyị jee kele Chukwu ọkaka eh K'anyị jee kele Ọmarịcha Chukwu Ọmarịcha Chineke Nna Bute ih'onyinye k'anyị jee Bute ngw'egwu k'anyị jee kele Chineke n'ụlọ nsọ ya, Chineke amaka Chukwu anyị amaka Chineke amaka mma Chukwu amaka. VERSE 2 Ọ bụ onye dịka Chineke m o? Ọ nweghị onye dịka ya! Ọ bụ onye mara mma ka Chukwu m o? Ọmarịcha Chukwu n'eluigwe Ọ nweghị onye yiri ya! Mma y'enweghị atụ! Ọ bụ gịnị k'anyị g'enye gị Chineke? Ọmarịcha Chukwu Ọla ọcha n'ọlaedo o zughị iji nye gị ekele.

Download the sheet music

Omaricha-chukwu

Omaricha-chukwu

By Chidi Ezigwe
Solfa
Igbo
3 pages
3 Downloads
Offertory Hymns Folk songs Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want