Full Lyrics
INTRO
Ihe Chineke n'eme
Ihe Chimo n'eme
Ihe nile n'eme n'ndụ m bụ oluebube Chukwu
Oluebube Chukwu kunie k'anyi kelee
CHORUS
Odogwu akataaka Onye n'emere m ihe dị mma
Odogwu akataaka Onye n'emere m ihe dị mma
Keleerem Chineke Onye n'eburum agha zọrọ zọ
Oluebube dị ịtọ
Ka Chineke n'arụ n'ndụ m o
Soronụ m kelee ya makana n'ọ bụ odogwu
VERSE 1
Ọpụpụ n'mbata m
Ọ bụ oluebube Chukwu
Ụzọ n'k'ọ gịrị m
Bụ oluebube ya
Lee oluebube nile Chineke ji chọọ m mma
Soronụ m tobe ya makana ọ bụ odogwu
Kunie k'anyi kelee
VERSE 2
Anam ahụ oluebube Chukwu
M lee anya n'azụ m o m hụ oluebube Chukwu
Akụ n'ụba nile m nwere bụkwa oluebube Chukwu
Ihe nile m nwere bụ oluebube Chukwu
Lee oluebube nile Chineke ji chọọ m mma
Soronụ m tobe ya makana ọ bụ odogwu
Kunie k'anyi kelee
VERSE 3
Ọ gbajiri igwe kpọọ ya nkụ
Odogwu akataaka dịk'ọgụ n'agha
Onye oluebube Chukwu ọma
K'ọbụ ih'ọma n'emere m o
Chi g'efo ma mụ agaghị akọcha
Lee oluebube nile Chineke ji chọọ m mma
Soronụ m tobe ya makana ọ bụ odogwu
Kunie k'anyi kelee