Full Lyrics
CHORUS
Kelee Ya n'ozieere Ya. Kelee Ya.
Kunie k'anyi kelee Ya n'ozieere Ya.
K'anyi kelee, kelee Olisa, jee jee jaa Ya nma.
Ihe nk'igwe ndigba kelee Ya jee jaa Ya nma.
Kelee Ya. Kunie k'anyi kelee Ya n'ọrụọlu Ya.
K'anyi kelee, kelee Olisa nk'igwe!
Chineke mo! Ọgba aka eje ogu!
Tobe Olisa nk'igwe, Ọ bu Ya kam jiaba!
Tobe Olisa nk'igwe, kele Chineke nk'igwe ndigba
Lekwesiri Ya. Kelee Ya n'ozieere Ya. Kelee Ya. Nna!
Obi Ya n'eje korọ m o! Ọ bu Ya n'echekwa ba m o!
Olisa e gboo keni ihe ọma nịle di n'uwa, ha busi ọrụaka Gi!
Ọn'ọlu Gi! Okwesiri Gi! Ozieere Gi!
Ekele diri Gi! Otito diri Gi! Ebube
Olisa doo!
Olisa Imelaa! Ihebube k'I n'eme!
Ma iru m'azu m, ihe di ebube ojuru m'anya.
Aka m di n'elu. Ọruo m gi.
Ekele diri gi, Okwesiri Gi, Otito diri Gi.
Ọrụọlu Gi. Ekele diri Gi! Okwesiri Gi. Otito diri Gi!
Oziere Gi, Igwe n'eche ndu mo!
Aka m di n'elu! Ọruo m gi.
Ekele diri Gi, Okwesiri Gi. Otito diri gi!
Oziere Gi! Chineke, Onyenma!
VERSE 1
Udara dara n'ala, emetughi aja.
Azu bi na mmiri adighagbu go mmiri.
Anyi bi n'uwa, njo zur'anyi ahu!
Onye njo kam bu mana Olisa elegharya njo mo.
O nwur'onwu n'obe, onwu ya k'ojiri zoo mo.
REFRAIN
Olisa, kelee leeleenuo.
K'anyi kelee, kelee Olisa kwe, ihe nile g'adi nma!
Bi n'igwe, I karisiri! Nare ekele anyi o, Nna!
VERSE 2
Chukwu kere nwa agu agagh'ekwe ka nwa agu taa ahịhịa.
Chi ma mkpa mo, I n'egboro m mkpa mo!
Onyiny' I nyere mo bar'uba Nna, ya ka m ji eme onu.
Ya ka m ji eme ngala. Agu n'eche mba mo, Olisa imeka.
VERSE 3
Nwa n'eso okenye, otagh'ose otaa oji,
makana aka naga n'akuku oku, n'agakwa n'akuku onu.
Onye n'eso gi n'azu Chineke, onwer'ihe nile.
Olisebuluwa n'azu mo, odigh'ihe koro mo.
Ochendo mo! Agu bata mgba d'awar'o so!