Olisa by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO K'anyi kelee Ya n'oruolu Ya, Kelee Ya n'okwesiri Ya, Jee jaa Ya mma! Tobe Olisa nk'igwe, Kele Chineke, lee Ya n'oziere Ya. REFRAIN K'anyi kelee, kelee Olisa, K'anyi jee jaa Ya mma. K'anyi kelee, kelee Olisa nk'igwe! Chineke mo! O gbuaka eje ogu, O bu Ya n'elekota mo! O bu Ya n'eche ndu mo! Olisa egbebi ko nare kele eh! Olisa doo! Ihe di ebube k'I neme! Ma iru m'azu m, ihe di ebube! O juru m'anya! Aka m di n'elu! Oruolu Gi. Ekele diri Gi! O kwesiri Gi! Otito diri Gi! O ziere Gi. Chi n'eme nma! VERSE 1 Udara dara n'ala emetu ge aja. Azu bi na mmiri adigh'agba gugo mmiri. Anyi bi n'uwa, njo zur'anyi ahu. Onye njo kam bu, mana Olisa elegh'anya na njo mo. O nwur'onwu n'obe, Onwu Ya k'ojiri zoo mo. Olisa bi n'igwe, I karisiri! Nare kel'anyi o, Nna! VERSE 2 Chukwu kere nwa ogu, agagh'elowe ka nwa ogu tua h'ihia. Chi mamkpa, I megboro m mkpa mo! Onyiny'I nyere mo baruba. Nna, ya kam ji eme onu. Olisa Imeka. Olisa bi n'igwe, I karisiri! Nare kel'anyi o, Nna! VERSE 3 Nwa n'eso okenye, O tagh'ose o taa oji, Makana akarlaga n'akuku oku, N'agakiwa n'akuku onu. Onye n'eso Gi Chineke, Onwegh'ihe nile. Olisa buluwa n'azu mo, O digh'ihe koro mo. Ochendo mo! Agu bate mgba d'uwa r'oso! Olisa bi n'igwe, I karisiri! Nare kel'anyi o, Nna!

Download the sheet music

Olisa

Olisa

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
13 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want