Full Lyrics
CHORUS
Ọkụ n'erere bịa nara aja rie
Ụmụ gị nọ n'obi gị Nna naasị gị mmamma
Biko nara ya Nna gọzie anyị
Onye nwe ndụ nara ya Nna gọzie anyị
VERSE 1
Nnanyị ha chunyere gị aja n'ugwu gị dị nsọ
Ị gbadataara n'ụdị ọkụ wee nara aja ha rie
N'oge nke anyị anyị naehunyeere gị achịcha n'iko mmanya
Ya biko nara ekele anyị o
VERSE 2
Ihe niile anyị bụ na ihe niile anyị nwere
Anyị naehunyeere gị ha maka ịja otito gị
N'aka gị ka anyị bidoro, n'aka gị ka anyị gaejedebe
Sọsọ gị bụ Chukwu anyị nwere Nna ribo otito anyị o
VERSE 3
Afọma gị bara ụba n'ebe anyị nọ
Ọgọ gbajuru doro o, ị bịara bụrụ Chi ekele o
Na otito ka anyị naebunye gị
Ọkụ eh, Ọkụ n'erere bịa nara aja rie
VERSE 4
Ndị niile dị ndụ na ndị niile nwụrụ anwụ
Anyị niile naele anya o, anya ebere gị
Cheta nzuko gị mgbe ị kere anyị niile
Ka aja nke a mee daa gị obi, Ọkụ n'erere