Full Lyrics
INTRO
Ogerugo, ogerugo, k'anyi kene ya
N'ezie but' onyinye gi.
Ogerugo, bia nye y'ekene,
K'anyi nye Chineke onyinye ruru ya si,
Nare ekene Chimoo
Eh! Ogerugo, k'anyi nye y'onyinye.
REFRAIN
Bute n'onyinye dinma bia kene ya,
Bute n'onyinye dinma n'obi ocha,
Onyiny' obi umeala,
Onyiny' obi ocha,
Were onyinye dinma bia si ya Nna daalu.
VERSE 1
Chukwu ebuka oluaka ya amaka.
Ngozi Chineke asogbue moo!
K'anyi nye y'onyinye.
VERSE 2
Ogerugo, k'anyi nye y'ekene,
But' onyinye dinma, k'anyi jee kene ya,
Onyinye si n'obi, ka Chineke n'acho,
Were onyinye dinma bia si ya Nna daalu.
VERSE 3
Onye fe Eze Eze rute y'aka
Onye fe Eze Eze rute y'aka
I kene ya na nk'o mere gi,
O g'eme re gi ozo maka na,
Onye fe Eze Eze rute y'aka
OSTINATO
Nye nu ya
Biko, k'anyi nye y'ekene,
Ogerugo, Ogerugo, ezi nwam!
Nye y'ekene, kene Chukwu,
Kene ya eh! Nwannem.
Nye y'ekene, kene ya, kene ya, kene Chineke, Chineke,
Biko k'anyi nye y'ekene, nwannem!
Ogerugo, nye y'ekene, nye y'ekene, nye y'ekene, ezinwam, nye y'ekene,
ACCAPELLA
Ogerugo, k'anyi nye y'ekene, eh!
Chukwu oma