Full Lyrics
Ogazi bu nnunu mar' ezigbomma, nke di uko, nke diokeonu!
Ahu ya mara mma, mma puriche n'aba n'anya,
Ugbene ya bu so mma. Mma zuru y'ahu!
Ndi Igbo tulekene, ndim jiemonu lokene!
Ndi Igbo lekene Aa iye o!
Ndi Igbo tulekene, Ndim jie monu lokene asiri n'Ogazia ma ka....
man'e jighi y'ago mmuo E wo!
Ogazi amaka! Ogazi amaka ma n'ejighi y'ago mmuo,
e jighi y'ago mmuo ewo nwannem
o cho mma jidekwa aku n'ihi n'onweghi ihe ji mma eme!
I jugo nu onwe gi ihe jiri hapu Ogazi
were jiri okuko achu aja ihughi na nsogbu di o?
I jugo n'onwe gi ihe jiri hapu Ogazi
were jiri okuko achu aja ihughi na nsogbu di o?
Ogazi amaka! Ogazi amaka ma n'ejighi y'ago mmuo,
e jighi y'ago mmuo ewo nwannem
o cho mma jidekwa aku n'ihi n'onweghi ihe ji mma eme!
I nwere ike icha ka anyanwu ututu
m'o bu Apu na nwu lota na mma si na Chi!
A di kwala k'Ogazi nke mara mma,
mm'amara n'ugbene ma n'onwegh'ihe jiy'eme!
O bu so mma k'I mara ka O bu ike k'I siri?
O nwere ihe ozo ag'eji hota gi?
A di kwala k'Ogazi nke mara mma,
mm'amara n'ugbene ma n'onwegh'ihe jiy'eme!
O cho mma jidekwa aku juo onwegia juju
o bu mma k'I g'eri?
Ola edo n'agbacha gbacha aku nu ba n'agwu kw'agwu.
O bu k'uwaa siri dio! Aye!
Ogazi amaka! Ogazi amaka ma n'ejighi y'ago mmuo,
e jighi y'ago mmuo ewo nwannem
o cho mma jidekwa aku n'ihi n'onweghi ihe ji mma eme!