ORU ITUNANYA by Fabian Ayogwu — Lyrics

Fabian Ayogwu Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] Leenu ọrụ ịtụnanya Leenu ọrụ ịtụnanya Leenu ọrụ ịtụnanya Leenu ọrụ ịtụnanya [REFRAIN] Leenu ọrụ ịtụnanya, lee ọrụ ebube Leenu ọrụ ịtụnanya Chineke naarụrụ ụmụ mmadụ Leenu anya ka ị hụ ngọzi Chukwu n'ime ndụ gị Ya weta añụrị buteere ya onyinye dị mma ruru ya n'ọbụ Chukwu. [VERSE 1] Ebube Chineke, ọrụ dị mma Amara barụba, ọrụ dị ebube bíanụ kele Ihe nile i nwere bụ onyinye Chukwu ya naazụ gị nwa nnem Ma ndụ i dị si n'aka Chineke gịnị k'igeji kele ya. [VERSE 2] Ebube Chineke, ọrụ dị mma Amara barụba, ọrụ dị ebube bíanụ kele Mgbe anyị naagagharị, ebube Chineke naechekwa nyi Ọpụpụ na mbata anyị nile dị n'aka Chineke kelenu ya. [VERSE 3] Ebube Chineke, ọrụ dị mma Amara barụba, ọrụ dị ebube bíanụ kele Cheta kwan'ọ bụ Chukwu n'enye mmiri n'oge nke ya ma anyanwụ Ị hụgo ọrụ ịtụnanya Chineke naarụrụ gị ụmụ mmadụ kelenu ya.

Download the sheet music

ORU ITUNANYA

ORU ITUNANYA

By Fabian Ayogwu
Solfa
Igbo
3 pages
77 Downloads
Offertory Hymns Hymns Uncategorized
0 0

More lyrics you may want