Full Lyrics
[INTRO]
Leenu ọrụ ịtụnanya
Leenu ọrụ ịtụnanya
Leenu ọrụ ịtụnanya
Leenu ọrụ ịtụnanya
[REFRAIN]
Leenu ọrụ ịtụnanya, lee ọrụ ebube
Leenu ọrụ ịtụnanya Chineke naarụrụ ụmụ mmadụ
Leenu anya ka ị hụ ngọzi Chukwu n'ime ndụ gị
Ya weta añụrị buteere ya onyinye dị mma ruru ya n'ọbụ Chukwu.
[VERSE 1]
Ebube Chineke, ọrụ dị mma
Amara barụba, ọrụ dị ebube bíanụ kele
Ihe nile i nwere bụ onyinye Chukwu ya naazụ gị nwa nnem
Ma ndụ i dị si n'aka Chineke gịnị k'igeji kele ya.
[VERSE 2]
Ebube Chineke, ọrụ dị mma
Amara barụba, ọrụ dị ebube bíanụ kele
Mgbe anyị naagagharị, ebube Chineke naechekwa nyi
Ọpụpụ na mbata anyị nile dị n'aka Chineke kelenu ya.
[VERSE 3]
Ebube Chineke, ọrụ dị mma
Amara barụba, ọrụ dị ebube bíanụ kele
Cheta kwan'ọ bụ Chukwu n'enye mmiri n'oge nke ya ma anyanwụ
Ị hụgo ọrụ ịtụnanya Chineke naarụrụ gị ụmụ mmadụ kelenu ya.