Full Lyrics
[Introduction]
Chineke Nna, Eze di ukwu,
Eze nwere ebube na otito,
sooso Gi Nna, ka m ga n'eto.
Toonu Ya, uwa nile.
[Chorus A]
Okwesiri k'anyi nye Chineke ekele.
K'anyi bunye Ya otito kwesiri Ya.
K'anyi sopuru Ya mgbe nile.
Otito Ya n'adi mgbe nile.
O bu Eze di nma,
Chineke kere uwa nile.
K'anyi keleenu Chukwu Nna.
K'anyi tobe Ya.
So Ya kere ihe nile, nye ha mmadu n'efu.
Too Ya.
[Verse One]
Chukwu bu Eze nke ihe nile.
Oke osimiri n'ebili mmiri n'erubere Y'isi.
Anyanwu na onwa na kpakpando n'agakwa njem ha n'anya
Chineke. Onyenwe m, onye di ka Gi? Chineke,
[Chorus B]
nara otito. Afoma Gi kariri nghot'ale,
Chukwu m, nara otito.
Umu mmadu Chineke, Chineke, Chineke nyi,
Chineke mo, Onye mara nma!
Chukwu mo, Chineke, Eze m.
Kpudebe, ezi nwanne m, k'anyi too Chukwu.
Tobenu Chukwu, toonu Ya.
Tobenu Chukwu, toonu Ya.
Tobenu Chukwu, toonu Ya.
[Verse Three]
Umunne m, kelee Ya, Chukwu d'ike!
Chee echiche nwanne m, che'echiche, chee.
Chee echiche doo nwanne m, che'echiche n'i m'obi gi,
banyere ihe omimi nke okike gi.
Aja akpur'akpu, uro na ntu ka mmadu bu.
Cheken'echiche nwanne m.
Obi oma Ya ka O ji eleta ndi nke Ya.
Chineke di nma nar'otito nile.
K'anyi tiere Dinwenu anyi egwu.
K'anyi gbabara Dinwenu anyi egwu.
K'anyi gosi hunanya na obi uto, si Chineke Nna,
[Chorus A]
"Ekele dikwara Gi".
[Verse Four]
Wetan'ubo k'anyi kpooro Dinwenu.
Wetan'une k'anyi kpooro Eze ker'uwa nile.
Werenu ekwe, weren'ubo bo n'ogene char'acha,
n'oja bu so uto, gbuerenu ya Onye kasi elu.
[Cantos Introduction]
Chineke Nna, Eze di ukwu,
Eze nwere ebube na otito,
Sooso Gi Nna, ka m ga n'eto.
Toonu Ya, uwa nile.
[Tutti]
Ekele n'otito n'adiri Chineke.
Otito n'ekele n'adiri Okakaa.
Umu mmadu bianu, bianu k'anyi too Chukwu.
Toonu Chukwu. Toonu Chineke.
Keleenu Ya, sopurunu Ya Oh Chukwu Nna kwu.
Anyanwu na kpakpando, onwa n'eti n'igwe,
oke osimiri nile toonu Ya.
Anumanu nile toonu Chukwu eh!
Umu mmadu biko, k'anyi too Chukwu.
Bianu, bianu toonu Ya, doo!
[Doxology]
Ya, Onyenwe m.
Otito diri Nna, otito diri Nwa.
Ato n'otu di Ngozi.
Kita, kita na mgbe ebigh'ebi.
Amen.