Full Lyrics
[INTRO / ACAPELLA]
Ọ bụ gịnị kam g'enye Gị Chukwuọma, gịnị kam g'enye Gị
Ọ bụ gịnị kam g'enye Gị Chukwuọma, ọ bụ gịnị kam g'enye Gị Nnam o
Ọ bụ gịnị kam g'eji kele Gị maka ihe i meere m o
Ị bụ Chukwuọma, Ị bụ Ọkaka
Ị bụ Chukwuọma Chineke Ọkaka
Ọ bụ gịnị kam g'eji kele Gị maka ihe i meere m o
Nara onyinye nkem ji bịa n'iru Gị Chukwuọma
Nara abụ otito n'ọnụ kam ji bịa n'iru Gị kele Gị o
[VERSE 1]
Nara ya kam jia ja Gị mma Ezi Nna doo
Nara ya k'onyinye Nna doo
Nara ya dị k'onyinye Nna doo
Nara onyinye nkem naebutere Gị O Chineke m o
Biko nara ya ma gọziekwa nwa Gị n'uju
Ahụ m niile bụrụ sọ ọnụ ozughị iji kele Chukwu
Ọnụ m apụghị ịkọcha ihe ọma Chineke meere m o
Ọnụ m apụghị ịkọ ọrụ ọma Gị n'ime ndụ m o, n'ime ndụ m o
Makana nkọwa ọrụ ọma Chineke n'ime ndụ m o
Ngọzi Chukwu barụba ọ n'ezo ka mmiri
Ọnụ m apụghị ịkọcha ya maka n'ọ n'ezo ka mmiri
N'ime ndụ m o, n'ime ndụ m o
Chi n'egbo mkpa m Chukwuọma ị bụ Chi m o
Amara Chukwu barụba ọ n'ezo ka mmiri
Chukwu dị mma o afọma Gị naezo ka mmiri
[VERSE 2]
Ezi Chineke Nna Onye n'eche ndụ m ụtụtụ n'abalị niile
Ị bụ Chi mara mkpa m o ị n'aza m mgbe m kpọkuru Gị
[CHORUS]
Ekele dịrị Gị Chineke Nna Onye obi ebere Chukwuọma
Otito Gị dị m n'ọnụ mgbe niile ebere Gị Chineke enweghị atụ
Afọma Gị karịrị akarị
Ọ bụ gịnị kam g'enye Gị iji sị Gị daalụ oh
Makana Ị bụ Chukwuọma
[OBLIGATO / FINALE]
Agam eji olum bukuoro Gị abụ otito
Maka n'ih'ọma ọ meere m o, ọnụ m apụghị ịkọcha ya
Chineke ndụ m o, Chineke ndụ m o
Chi n'agwọ ọrịa m o, Chi n'aza m mgbe m kpọkuru Ya
Ezi Chineke dị obiọma nara ekele m o Chi m o
Aga m ekwuputa otito Gị ebe niile O Chineke m o
Amamihe nk'Ị nyere m ọkankịti Chineke m o
Ahụ ike nk'Ị nyere m ọbụnankịti Chineke m o
Ọ bụ Gị bụ Chi m o onye ọma naemere m ih'ọma
Odogwu n'agha nara ekele m nara ih'onyinye m o daalụ o Nna
Agam eji olum bukuoro Gị abụ otito
Otito dịrị Gị Chineke Nna
Otito dịkwara Mmụọ Nsọ n'ụwa ebighị ebi
Amen, Amen, Amen.