K'ANYI JEE N'OBI EZE by Linus Okwu — Lyrics

Linus Okwu Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

Ọbịna sọ mụ o, ai yei ye Ọbịna sọ mụ o, ai yei ye Mgbe m nụrụ ka a naasị E k'anyị je nụ n'ụlọ nsọ Ai yei ye, Ọbịna sọ mụ o, ai yei ye K'anyị jee n'obi eze Onye ihe nile dị n'aka ya Ai yei ye, Ọbịna sọ mụ o, ai yei ye Onye n'enwero mbido nke o jie nwe njedebe Ọchị nile, Eze ukwu Nwannem, ai yei ye Ọbịna sọ mụ o, ai yei ye We n'añụrị bata k'anyị kele Chineke onye ọma Ai yei ye, Ọbịna sọ mụ o, ai yei ye Oseburụwa na n'ekele Onye nwe mmadụ a bịara mbe gị Ai yei ye Anyị sị k'anyị bịa kpọrọ ị isiala Ihe ị naanara anyị ebuka Ai yei ye Ogologo ndụ gị n'enye anyị Ahụ ike anyị dị gị n'aka Ai yei ye Ji n'edu anyị n'akọ bụ ọnụ aka Gị Ụmụ n'ụba anyị byọrọ aka Gị Ai yei ye Ya k'anyị ji bịanị ra Gị Ịkpọrọ Gị isiala Ai yei ye [Chorus] Ọma lee, ihe ọma nile dị n'ụwa Ebubebube bube Ọmalịcha Ugwu na ndịda ha ncha bụ ọrụ aka ya Ọmalịcha Ọnwa na kpakpando nwanne m Ọkwa Chukwu ke ha Amen ụmụnna m a nụala tobe Chukwu Ụwa na ihe ọma nile dị n'ime ya bụ nke Gị Ezi Chukwu Gị nwe ekele taya Onye Chineke anyị bịara mbe gị Ọmalịcha, Ọmalịcha, Ọmalịcha Ọbịna sọ mụ o ai yei ye K'anyị jebe n'ụlọ be Chukwu Rịọ ya mgbaghara K'anyị je gbuoro ikpere Rịọwa ya mgbaghara K'anyị je n'ihi Chineke m rịọkwa ya ngozi Na missa dị asọ Chukwu Naakpudebe anyị nsọ Ọ naedokwa anyị nsọ Ai yei ye

Download the sheet music

K'ANYI JEE N'OBI EZE

K'ANYI JEE N'OBI EZE

By Linus Okwu
Solfa
Igbo
4 pages
5 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want