Full Lyrics
CHORUS
Mama mama! Nneọma!
Onwere nne ka nne mụrụ ọkaka?!
Onwere nne ka nne mụrụ ịmma?!
Onwere nne ka nne mụrụ Olisa?
Naanị Maria menwụ ya!
K'anyị kpọọ ya Nne ka nne!
Nne ka nne! kpọọnụ ya Nne ka nne!
Nne kanne! Maria bụ Nne ka nne, Nne dị umeala!
Ekele dịrị gị, Achalugo nwaanyị!
VERSE 1
Ọ bụ onye ka anyị gaakpọ mama?
Eh! Asi mụ ọbụ onye ka anyị gaakpọ mama? eh! Nne Chukwu nechara si na ya pụta
Eh! Nne juputara na gurasia;
Maria, Maria, Maria Nne ka nne!
Eh! Maria, Maria, Nne ka nne eh!
VERSE 2
Onye nwere nne dịka Mary nwere ezi nne!
Onye nwere nne dịka Mary nwere nne ọma!
Onye nwere nne dịka Mary nwere nne dị umeala,
Nne bụ sọ mma, Mara na onye Ima
kpọọ ya Mama ma!
REFRAIN & CALLS
Maria di aso! Achalugo, Maria Mama eh biko,
rịọbara anyị arịrịọ, kpebere anyị ekpere!
Oh Maria, Vejin Mary
rịọbara anyị arịrịọ, kpebere anyị ekpere!
Eze nwaanyị nke Naijiria!
rịọbara anyị arịrịọ, kpebere anyị ekpere!
Nne Mama anyị ọ, Nne papa anyị ọ
rịọbara anyị arịrịọ, kpebere anyị ekpere!
Nne Mezaya! Nne ụwaa!
rịọbara anyị arịrịọ, kpebere anyị ekpere!
nara nuanyị ekene;
Achalugo, Maria Mama eh biko,
rịọbara anyị arịrịọ, kpebere anyị ekpere!
nara nuanyị ekene!
Nne ka nne!!