Full Lyrics
VERSE 1
Bịa Mmụọ Nsọ biri n'obi ndị kwere nụ
n'ime obi anyị nye anyị amamihe
nye anyị ndụmọdụ
nye anyị nghọta na ndụ anyị Mmụọ Nsọ
VERSE 2
Bịa Mmụọ Nsọ biri n'obi anyị
munye ọkụ nk'ihụnanya Gị
mee ihu ụwa k'ọdị ọhụrụ
nye anyị ọmụma yana egwu Chukwu
nye anyị ike na ndụ anyị Mmụọ Nsọ
VERSE 3
Nye anyị nsọpụrụ nke Chukwu
Mmụọ Nsọ anyị n'arịọ
k'anyị bụrụ ezi ụmụ nke Chukwu
Mmụọ Nsọ