MMADU BU IHE EFU by A. H. Oramasionwu — Lyrics

A. H. Oramasionwu Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Mmadụ bụ ihe efu, mmadụ bụ ihe nkịtị. Mmadụ bụ ihe efu, mmadụ bụ ihe nkịtị. Ihe mmadụ bụ n'ụwa bụ ntụ na aja. Mmadụ bụ ihe efu, mmadụ bụ ihe nkịtị. Leenụ nwanne anyị ebe o togbosọ n'ozu. Mmadụ bụ ihe efu, mmadụ bụ ihe nkịtị. Jụọ onwe gị ajụjụ nwa nnem, onye k'ọga bụ echi. Mmadụ bụ ihe efu, mmadụ bụ ihe nkịtị. VERSE 1 Elegom anya n'elu ụwa wee hụ n'ụwa e nweghị si oche. Elegom anya n'ụwa wee hụ n'ụwa bụ ihe efu. N'acha nile mmadụ n'amacha n'ụwa bụ ihe nkịtị. "A bumm nkea, a bumm nke ọzọ" ọ sụ maka ị n'eku ume. VERSE 2 Elegi derem oke mpako juru n'ụwa mmadụ nọ n'ime ya. M wee fee n'isi jụọ onwem ajụjụ sị, kedu ihe mmadụ bụ? Mmadụ ji eme nganga. Mmadụ chegharị kene bibe ezi ndụ maka n'ụwa bụghịa onye zuru nke y'e jaba. VERSE 3 Ọka mma ị gbaba n'ime Chukwu. Ọka mma ị fe Onye nwe anyị, ofufe febe ya n'ime mmụọ n'eziokwu. Afọ one, mmadụ ibiri n'ụwa a bụghị ihe dị mkpa nwa nnem kama ị kebu ezi okwu. VERSE 4 Ọrịa kacha sị njọ n'ụwa mmadụ g'arịa bụ ọrịa ị maghị Chukwu. Ibu kacha sị ọlọ n'ụwa bụ ibu nke njọ. Kristi kwuru sị abụm ụzọ bụrụ eziokwu na ndụ. Onye n'esom g'enweta nzọpụta, sobe ya.

Download the sheet music

MMADU BU IHE EFU

MMADU BU IHE EFU

By A. H. Oramasionwu
Solfa
Igbo
3 pages
5 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want