Mma-mma Ekele by Chidi Ezeigwe — Lyrics

Chidi Ezeigwe Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Lekene ngọzi Chukwu n'ime ndụ mo Lekene ebube Chineke n'ahụ mo Amara nke Chineke barụ ụba Chineke daalụ daalụ ịbụ chi mo Chineke daalụ mma mma ekele. VERSE 1 Ọ bụ onye kam bụ na Chineke nna chetara mo Ọ bụ onye kam bụ chi n'echere nwa ya Onye njọ dịka m nna kilechara gọzie Amara gị ebuka na ndụ ndị nke gị. VERSE 2 N'ihi ngọzi gị nna kam jiri bịa n'ụlọ gị Wee buru ih'onyinye bata n'ụlọ gị ikele gị Ibulirim elu nna wee dobem n'ọkwa dị elu Nar'onyinye nkem ji atụ mma mma Chineke. VERSE 3 Ebube Chineke n'ime ndụ m karịrịa karị Amara Chineke n'ime ndụ m barụba Ngọzi Chineke efesago m ka mmiri eh Ị hụrụm n'anya daalụ daalụ Chineke. VERSE 4 Chukwu gọzirim agọzi ndị enyị m niile bịa Agbat'obi mo soro m kele Chukwu Ndị ikwu n'ibe m k'anyi jee nya ya mma Ngwanụ k'anyi jee tụọrọ ya mmamma.

Download the sheet music

Mma-mma Ekele

Mma-mma Ekele

By Chidi Ezeigwe
Solfa
Igbo
2 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want