Mkpu ọṅụ Na Abụ Otito by Fabian Anggwy — Lyrics

Fabian Anggwy Igbo Entrance songs Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Mkpu ọṅụ na abụ otito kam jiri bịa Ka m tụọrọ Gị mmamma Oh Chineke Nna ekele Ekele, otito na nsọpụrụ na isiala dịrị Chukwu Lee nụ amara nile juru anya Chim n'emere m oh Ihe ọma Chim meere m, gịnị kam g'akwụghachi ya CHORUS Kele nụ Chineke, were nụ egwu tobe nụ ya Kele nụ amara nile juru anya Chim n'emere m oh Ihe ọma Chim meere m, gịnị kam g'akwụghachi ya Oh tikwusie Kele nụ Chineke, were nụ egwu tobe nụ ya Kele nụ Chineke anyị mkpu ọṅụ n'ihi na Chineke bụ Odogwu; n'ihi na Chineke bụ anya n'elegwa, Ihe nile dị ya n'aka Ọ bụ n'aka Chineke ka ha ncha dabeere Ka ugwu na ugwu nile tobe Chineke Nna, tobe ya Ka onye ọbụla Chineke gọziri weregwu kulite kanyị too ya. VERSE 1 Ọṅụ ọchị dị m n'ihu, ọṅụ dị m n'obi n'ihi na Chineke Nna emeworo m mma Chukwu bụ Onye amara Ebe O nyere m ndụ n'ezie nyekwa m ahụ ike Ukwu otito kam ji n'ekele ya, Ọ bụ Odogwu. VERSE 2 Chineke Nna hụrụ anyị n'anya eh, hụrụ anyị n'anya Onye hụrụ ụwa n'anya, lee k'O si eleta ụmụ ya anya. Ọnwa na kpakpando dị n'igwe, Onye kere ha? Chukwu. Anyanwụ na mmiri nke si n'igwe, Onye kere ha? Chukwu. Ukwe otito kam g'eji wee kele Chukwu dị mma. VERSE 3 Ihe nile e kere eke gaeto Chukwu ma n'ugwu ma na ndịda, ma n'oke osimiri, anụ ufe naefegharị Osisi na anụ ukwu, ihe nile nwere ndụ n'ekume too Chineke bụ Chukwu dị mma.

Download the sheet music

Mkpu ọṅụ Na Abụ Otito

Mkpu ọṅụ Na Abụ Otito

By Fabian Anggwy
Solfa
Igbo
5 pages
6 Downloads
Entrance songs Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want