Full Lyrics
INTRO
Mkpu ọṅụ na abụ otito kam jiri bịa
Ka m tụọrọ Gị mmamma
Oh Chineke Nna ekele
Ekele, otito na nsọpụrụ na isiala dịrị Chukwu
Lee nụ amara nile juru anya Chim n'emere m oh
Ihe ọma Chim meere m, gịnị kam g'akwụghachi ya
CHORUS
Kele nụ Chineke, were nụ egwu tobe nụ ya
Kele nụ amara nile juru anya Chim n'emere m oh
Ihe ọma Chim meere m, gịnị kam g'akwụghachi ya
Oh tikwusie
Kele nụ Chineke, were nụ egwu tobe nụ ya
Kele nụ Chineke anyị mkpu ọṅụ n'ihi na Chineke bụ Odogwu;
n'ihi na Chineke bụ anya n'elegwa, Ihe nile dị ya n'aka
Ọ bụ n'aka Chineke ka ha ncha dabeere
Ka ugwu na ugwu nile tobe Chineke Nna, tobe ya
Ka onye ọbụla Chineke gọziri weregwu kulite kanyị too ya.
VERSE 1
Ọṅụ ọchị dị m n'ihu, ọṅụ dị m n'obi n'ihi na Chineke Nna emeworo m mma
Chukwu bụ Onye amara
Ebe O nyere m ndụ n'ezie nyekwa m ahụ ike
Ukwu otito kam ji n'ekele ya, Ọ bụ Odogwu.
VERSE 2
Chineke Nna hụrụ anyị n'anya eh, hụrụ anyị n'anya
Onye hụrụ ụwa n'anya, lee k'O si eleta ụmụ ya anya.
Ọnwa na kpakpando dị n'igwe, Onye kere ha? Chukwu.
Anyanwụ na mmiri nke si n'igwe, Onye kere ha? Chukwu.
Ukwe otito kam g'eji wee kele Chukwu dị mma.
VERSE 3
Ihe nile e kere eke gaeto Chukwu ma n'ugwu
ma na ndịda, ma n'oke osimiri, anụ ufe naefegharị
Osisi na anụ ukwu, ihe nile nwere ndụ n'ekume too Chineke bụ Chukwu dị mma.