AFUFU MMUO (Story of the Cross) by Sam Ojukwu — Lyrics

Sam Ojukwu Igbo Lenten Hymns Holy Week Hymns Anthems Palm Sunday Solfa notation

Full Lyrics

Soprano Solo O afụfụ nmụọ Jesu talụ anyị. Tutti O afụfụ nmụọ Jesu talụ anyị. Nee negodu ka Jesu Kristi si we bịa n'ụwa lụba ọlụ dị nma. Ọ lụ ifunanya, ọ lụ Chukwu. Ọ lụ ebube Chukwu. Ma ọ gịnị k'ụmụ ụwa ji kwụa Ya ụgwọ? Ọnwụ n'enu obe. O afụfụ nmụọ Jesu talụ anyị. Baritone Solo Ma ọ gịnị ka Jesu melu fa, fa ji achọ ya ka ọ nwụa? Ka ọ nwụa ọnwụ ifele n'enu obe. Ụmụ nnem, ụmụ nnem ajụam o, Ọ bụzịkwa Jesu Kristi melu ka ndị ngwọlọ wụba ujọ njọlị? Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melu ka ndị kpu isi fụba ụzọ k'ugo? Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melu ka ndị agụụ n'agụ liju afọ? Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melu ka ndị nwụlụ anwụ we kubekwa ume ndụ ọzọ? Ma ọ gịnị k'ụmụ ụwa ji li kwụa Ya ụgwọ? Chorus Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe. Baritone Solo (contd) Ọ fa echezọgo ka fa si tie Hossana, Hossana, Hossana, Hossana dịlị nwa David n'ebe kasi enu. Hossana, Hossana, Hossana dịlị eze anyị o, mana okweghị zu ha etighalịa. Chorus Ọnwụ, ọnwụ n'enu obe. O afụfụ nmụọ Jesu talụ anyị. Soprano Solo (with obligato Chorus) O afụfụ nmụọ, O afụfụ nmụọ Jesu tara anyị. N'egodu anya ka ha si bo ya ebubo. Ụfọdụ asị n'ọ naeme arụ, n'ọsị na ụtụ ana atụ maka Caesar na oziro ezi n'iwu, n'ọbụ Ya bụ eze. Bụlụkwanta n'imo Pilati asị na ya fụrọ ife omelu dị njọ, ka ya dọa ya ọdụ mana ha ekweghị ekwe ha asị Ọnwụ.

Download the sheet music

AFUFU MMUO (Story of the Cross)

AFUFU MMUO (Story of the Cross)

By Sam Ojukwu
Solfa
Igbo
4 pages
5 Downloads
Lenten Hymns Holy Week Hymns Anthems Palm Sunday
0 0

More lyrics you may want