LEENU YA by CHUKWUDINKA I. C — Lyrics

CHUKWUDINKA I. C Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Leenu ya ihe anyị bụ k'ọ bụ na mbụ leenu ya Ọ h'ọ bụ ugbu a k'anyị nile g'abụcha mgbe oge g'eru VERSE 1 O kw'eburu ozu onye ọzọ ọ dị k'ebu osisi kpọrọ nkụ Lekwanụ n'ọ bụ ụz'ahụ ọgara ka anyị nile g'aga VERSE 2 Mkpụrụ ụbọchi ole gara aga anyị na ya nọ anyị na ya N'ekwu koriokwu n'akpa nkata ma n'ugbu a ọ bụzi ozu VERSE 3 Leenu onye anyị na ya n'erie ri a nụa nụ k'ọ dị na n'ozu Ụwa nke a enweghị isi ụwa bụ ihe nkịtị VERSE 4 Leenu ya bịanụ hụrụ ya ihe ahụ ọbụ Tata k'anyị nile g'abụcha mgbe oge g'eru VERSE 5 Ezi nwa nnem jụọ onwe gị ajụjụ onye k'ọ g'abụ echi Ọ bụ mụ k'ọ bụ ngị onye ọbụla kwado onwe ya na ọg'agwụla

Download the sheet music

LEENU YA

LEENU YA

By CHUKWUDINKA I. C
Solfa
Igbo
1 page
3 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want