Full Lyrics
REFRAIN
Leenu ya ihe anyị bụ k'ọ bụ na mbụ leenu ya
Ọ h'ọ bụ ugbu a k'anyị nile g'abụcha mgbe oge g'eru
VERSE 1
O kw'eburu ozu onye ọzọ ọ dị k'ebu osisi kpọrọ nkụ
Lekwanụ n'ọ bụ ụz'ahụ ọgara ka anyị nile g'aga
VERSE 2
Mkpụrụ ụbọchi ole gara aga anyị na ya nọ anyị na ya
N'ekwu koriokwu n'akpa nkata ma n'ugbu a ọ bụzi ozu
VERSE 3
Leenu onye anyị na ya n'erie ri a nụa nụ k'ọ dị na n'ozu
Ụwa nke a enweghị isi ụwa bụ ihe nkịtị
VERSE 4
Leenu ya bịanụ hụrụ ya ihe ahụ ọbụ
Tata k'anyị nile g'abụcha mgbe oge g'eru
VERSE 5
Ezi nwa nnem jụọ onwe gị ajụjụ onye k'ọ g'abụ echi
Ọ bụ mụ k'ọ bụ ngị onye ọbụla kwado onwe ya na ọg'agwụla