Full Lyrics
[INTRO]
Kweben'ukwe kweben'ukwe kweben'ukwe kweben'ukwe
Maka na onye nzọpụt'ụwa Dinwenụ anyị Kristi abịago.
Kweben'ukwe kweben'ukwe kweben'ukwe kweben'ukwe
Maka na onye nzọpụta ụwa Kristi abịago.
[CHORUS]
Ụwa nile ṅụrịba
Ụwa nile ṅụrịba, ṅụrịba o
Ụwa nile ṅụrịba
Ụwa nile ṅụrịba.
Amụgoro anyị Eze
Eze, eze ụwa nile
Eze abịago
Eze abịago
K'anyị ṅụrịba maka na Kristi abịago.
[SECTION B]
Nwa Chukwu nyer'anyị
Eh onye nzọpụta ụwa nile
Eh ihe ukwu mere n'eluigwe n'ụwa
K'anyị ṅụrịba, ṅụrịbanụ eh
Kristi abịago.
Le ṅụrịba
Ụwa nile ṅụrịba, ṅụrịba o
Ụwa nile ṅụrịba
Ụwa nile ṅụrịba.
Amụgoro anyị Eze
Eze, eze ụwa nile
Eze abịago
Eze abịago
K'anyị ṅụrịba maka na Kristi abịago.
[SOPRANO SOLO]
Eh kelenụ Chukwu ker'ụwa
Ụmụ ụwa tibenụ Alleluia eh!
Onye nzọpụta abịago abịago
Onye isi udo onye ndụmọdụ
Aha ya bụ Immanuel
Nna nke dị ebighebi, ebighebi
K'anyị tobe Chukwu dị ebube.
[SECTION C]
O mewor'anyị ihe ukwu
O mewor'anyị ihe ukwu.
Kweben'ukwe kweben'ukwe
Kweben'ukwe kweben'ukwe
Maka na Onye nzọpụta ụwa Dinwenụ anyị Kristi abịago.