KRISTI EBILITEGO N'ONWU by Chidi Zeigwe — Lyrics

Chidi Zeigwe Igbo Easter Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] K'anyị ṅụrịba nụ na Kristi ebilitego n'ọnwụ K'anyị ṅọrịbe nụ na Kristi ebilitego n'ọnwụ Ụwa nile kweb' ukwe aṅụrị Mba nile kweb' ukwe ngọrị Na Kristi emerigo ọnwụ o Mba nile ṅọrịe nụ Kristi emerigo ọnwụ Halleluia, Halleluia Halleluia, Halleluia Halleluia, Halleluia [VERSE 1] Ekele dịrị gị Chukwu Nna Iziter' Ọkpara gị maka mgbapụta mmadụ Nwụrụ n'elu obe maka njọ nke ụwa nile N'ụbọchị nke atọ, o bilite n'ọnwụ Onye ike, onye ike, Halleluia [VERSE 2] O meriri ike ọnwụ O meriri ike ili wee tunigo mmeri Ọnwụ olee ike gị o? Ike ili olee ike gị o? Dinwenu Jesu ebilitego n'ọnwụ Halleluia n'ebe nile [VERSE 3] Jesu Kristi emerigo ọnwụ Ike r'ike Odogwu n'agha Ekele dịrị gị Dinwenu Otito dịrị gị onyenwe anyị Halle halle, Halleluia, Halleluia

Download the sheet music

KRISTI EBILITEGO N'ONWU

KRISTI EBILITEGO N'ONWU

By Chidi Zeigwe
Solfa
Igbo
2 pages
2 Downloads
Easter Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want