KRISTI EBILIGO N’ỌNWỤ by Chibi — Lyrics

Chibi Igbo Easter Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Unu mana Kristi ebiligo n'ọnwụ? REFRAIN Kristi ebiligo eh! Kristi ebiligo n'ọnwụ. Eh! merig'ik'ọnwụ ony'ọbụla gbab'egwuọma eh na Kristi ebiligo eh ony'ọbụla goribe eh na Kristi ebiligo eh! Kristi nwa Chukwu, O bilitego n'ezie kee sị kwụ naakwụkwọnsọ, n'ụbọchịatọ n'ọg'ebili n'ọnwụ. O biligo! O biligo, O biligo, O biligo, O biligo, Kristi nwa Chukwu eh! Kristi ebilitego n'ọnwụ. VERSE 1 Añụrianyị n'enwe bụ na Kristi ebiligo, asị na Kristi ebilighi n'ọnwụ, Ị mana nke mmadue kpogo. Mana Kristi, Onye mmeri, n'ezie, O biligo n'ọnwụ. O biligo! VERSE 2 N'ụzụụtụtụ, Meri nọ n'ili Ya, Ọ n'ebe, Ọ n'etimkpu, n'Ọ hụghi Dịnwenụ, mana, Mmụọzi Chukwu gwara ya, na Kristi ebiligo n'ọnwụ. O biligo! VERSE 3 Meri aghọtaghi ozi a Mmụọzi zịrị ya, Meri wer'ọsọ jee gw'ụmaazụ Ya ka Mmụọzi Chukwu sịrị kwu, na Kristi ebiligo n'ọnwụ. O biligo! VERSE 4 Pịta na Jọn wee gbaga n'ili Ya, Jọn erue nọrọ n'ụzọ chebe Pịta, ma mgbe Pịta rutere, haa banye hụụ n'Obiligo n'ọnwụ. O biligo! VERSE 5 Akaja niile emere Ya, O merigo ha, kedu Jụdas? Ngwa bịa susuo Y'ọnụ. Ndị agha eh! bịanụ jidezie Ya. Kedu Kefas? Ị dọkasịgoakwa Ya? Ndị ụkọ Chukwu eh oge ịzụ erugokwa. Govanọ, Ị kwọsịgoaka gị eh? Ị maar'eziokwu, were egwu ma Y'ịkp'ọnwụ. Ndị Jụụ sịkwa k'ọbara Ya dị n'ịsị ha, na nk'ụmụ ha, eber'unue mego mo. Kedu ndị ahụ naakọ nwa Chukw'ọnụ? Ọ bụrụ n'Ị bụ Mezaya, zọpụta n'onwe Gị; n'ezie, ọ burụ n'Ị bụ nwa nke Chineke, sị n'elobe rịdata k'anyị kwerezie. Bịanụ hụrụ n'O merigo. Awa unua gasịgo, ugbua bụzị oge mmeri, O merigo. CHOIR OSTINATO Ngwa bịa hụrụ n'O merigo.

Download the sheet music

KRISTI EBILIGO N’ỌNWỤ

KRISTI EBILIGO N’ỌNWỤ

By Chibi
Staff & Solfa
Igbo
3 pages
0 Downloads
Easter Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want