KRISTI EBILIGO by CYRIL VICTOR UGONNA — Lyrics

CYRIL VICTOR UGONNA Igbo Easter Hymns Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Ụmụ ụwa nụrụ olu m ka m n'gba akaegbe mbiliten'ọnwụ Kristi. Nwa nke Chukwu onye akpọgburu n'obe o nwụọ ọnwụihere ka o ruru ụbọchị atọ ya o si n'ọnwụ bilie. Ọnwụ eh, olee eb'ị nọ? Ị gar'ahịa? Ị gara ozi? Ị jer'ọmụgwọ? Ọnwụ eh, ọnwụ eh, chai! Ọnwụ mmehntọ, Kristi emerigo ọnwụ. Ọnwụ mmehntọ, Kristi emerigo. CHORUS Kristi ebiligo eh, Kristi emerigo ọnwụ. Kristi ebiligo eh, Nụrịbanụ n'o merigo eh. Ọnwụ eh, ọnwụ olee ike gị? Ọnwụ eh, ọnwụ olee ụfụ gị? Mgbe Kristi bilitere n'ọnwụ, Zaanụ m oo olee eb'ị nọ? VERSE 1 Ụmụnne m bíanụ lee n'ili emeghela eh, Ik'ọnwụ adawo mba n'ezie Kristi emerigo eh. VERSE 2 Ụwa n'ile nụrịba o n'Ọkpara Chineke emerigo eh, Gwa mba n'ile sị ha na Kristi ebiligo eh. VERSE 3 Mmụọma Chineke gwara ụmụnwanyị ahụ sị ha, Tụle egwu na Kristi akpọgburu n'obe ebiligo eh. VERSE 4 Ik'ọchịchịrị adawo mba n'ezie Kristi emerigo ọnwụ, Tibenụ mkpu ọñụ n'egoli na Kristi emerigo eh.

Download the sheet music

KRISTI EBILIGO

KRISTI EBILIGO

By CYRIL VICTOR UGONNA
Solfa
Igbo
3 pages
0 Downloads
Easter Hymns Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want