Full Lyrics
CHORUS
Ure m
Chukwu nara aja anyị, gozie ya nna.
Wer' anyị ka anyị ra.
Ure m
Chukwu nara aja anyị, gozie ya nna.
Wer' anyị ka anyị ra.
Anyị ma na anyị etorughị inye gị aja m'ọ bụ nke ruru gị,
ma nna na anyị, wer' anyị ncha ka anyị ra.
Ure m nara.
VERSE 1
Ihe e kere eke, ha ncha bụ ihe dị mma ihe mara mma,
maka n'onye kere ha ncha bụ Chukwu bụ ezi Chukwu n'ememma.
Nara n'ọ bụ ihe dị mma ihe mara mma,
maka n'ị bụ Chukwu bụ ezi Chukwu n'ememma.
Onyinye anyị nyere, ha ncha bụ ihe dị mma ihe mara mma,
maka n'onye kere ha ncha bụ Chukwu bụ ezi Chukwu n'ememma.
Nara n'ọ bụ ihe dị mma ihe mara mma,
maka n'ị bụ Chukwu bụ ezi Chukwu n'ememma.
Nke a ka anyị ji asị gị nna, nara anyị ihe dị mma b'ihe e kere,
sọsọ ya ka anyị gaenwe.
Nya ka anyị ji arịọ...
VERSE 2
Gwanụ m ihe anyị gaenye onye nwe anyị.
Gwanụ m ihe anyị gaenye onye nwe anyị.
Chukwu bi n'igwe, Chukwu bi n'ọma, Olisa buru ụwa ka anyị naenye.
Gwanụ m ihe anyị gaenye onye nwe anyị.
Gwanụ m ihe anyị gaenye onye nwe anyị.
Chukwu kere anyị ncha n'onyinye anyị naenye ya.