Full Lyrics
[Verse 1]
Ọ bína sọ mụọ ai yei ye
Nụrụ k'aa na si
K'anyị jee nụ n'ụlọ nsọ
Bína sọ mụọ ai yei ye
Mụ n'obi eze
Onye ihe nile dị n'aka ya
Onye jid' k'aya dịrị n'onwe ya
Onye n'enwerọ mbido nke o jie nwe njedebe
O Chineke eze ukwu Nnannem
Wer' aṅụrị bata k'anyị kele Chineke Onye ọma
[Verse 2]
Oseburụwa nar' ekele
Onye nwe mmadụ a bịara m be gị
Anyị si k'anyị bịa kpọrọ ị isiala
Ihe ị n'emere anyị ebuka
Ogologo ndụ gị n'enye anyị
Ahụ ike anyị dị gị n'aka
Ji n'ede anyị n'akọbụ ọrụ aka gị
Ụmụ n'ụba anyị bụ ọrụ aka gị
Ya k'anyị ji bịa n'ihu gị kpọrọ gị isiala
[Verse 3]
Ọmalịcha le dị n'ụwa ebube bube
Ugwu na ndagwurugwu nile hanchabuoru aka ya
Ọnwa na kpakpando nwanne m
Ọkwa Chukwu ker' ya
Anụ enu na anụ mmiri a nụa la tobe Chukwu
Ụwa na ihe ọma nile dị n'ime ya bụ nke gị
Ezi Chukwu gị nelekọta ya
Onye eze Chineke a bịara m be gị
Ọmalịcha, Ọmalịcha
[Verse 4]
Ọ bína sọ mụọ, Ọ bína sọ mụọ
K'anyị jebenu na be Chukwu je rịọ ya mgbaghara
K'anyị je gbusa ikpere ala rịọ nwa ya mgbaghara
K'anyị jee n'ihu Chineke ma rịọ kwa ya ngọzi
Na missa dị asọ Chukwu naakpude be anyị nsọ
Ọ naedo kw'anyị nsọ
Ọ n'enye kw'anyị ngọzi
O Chineke gbadata k'anyị na gị nọrịa
[Alto Solo]
Chineke ahụka m n'anya
Ọ hụrụ m n'anya
[Bass Solo]
Nwanne m biko kam jụke ne gị
Ngọzi a nile ọ nerukwa gị aka ewo
[Chorus]
Chinek' ahụka m n'anya nwanne m
Chinek' ahụka m n'anya
Ke dọnke bụ na gị n'ị bụ na Chineke
Chukwu zitere Nwa ya k'o zọpụt' anyị
Si n'onye riri ya g'enwe ndụ
Onye hụrụ go jaa ya mma
Onye riri ọjị kpaa ya nkụ
Eh ụmụ Chineke buru ngwa egwu k'anyị tiere y'egwu
Ngwanụ k'anyị jee bịanụ bịa tiere y'egwu dị mma
Ngwanụ k'anyị jee kpọnụbọ ụbọ dị mma tiere y'egwu dị mma weta oge
Ngwanụ k'anyị jee bịanụ bịa tiere y'egwu dị mma
Bịtanụ ngwongwo k'anyị kpọrọ Chineke tie be egwu dị mma
[Refrain]
Egwu ọma, tiri tiri, tum tum tum
[Soprano Solo]
Anyị n'alere egwu dị mma
Egwu anyị ji e to Chukwu
Chukwu onye nyer' anyị nzọpụta
Chukwu n'egboro m mkpa m
Onye nụtuwa nuye ya
Onye bere onye ọma k'o bụ
Chukwu ebuka, Chukwu ebuka
K'anyị jee ṅụrịa missa dị asọ je zute ya
[Refrain]
Egwu ọma, tiri tiri, tum tum tum