K'ANYI JEE N'OBI EZE by Linus Okwu — Lyrics

Linus Okwu Igbo Entrance songs Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

[Intro / Verse 1] Obi naasọ mụọ ai yei ye Obi naasọ mụọ ai yei ye Nụnụ ka a naasị ee k'anyị jeenụ n'ụlọ nsọ K'anyị jeenụ n'obi eze Onye ihe niile dị n'aka ya Onye je akọ ya dịrị n'onwe ya Nwe rọ mbido nke o jiri nwe njedebe O Chineke eze ukwu Nwannem wer' aṅụrị bata k'anyị kele Chineke ony'ọma [Bass Solo 1] Oseburụwa nara ekele o Anyị sị k'anyị bịa kpọrọ gị isi ala Ihe ị naemere anyị ebuka Ogologo ndụ gị n'enyegnyị Anụikegnyị dị gị n'aka Iji naedegnyị n'akọ bụ ọrụgkasị Ụmụ n'ụbanyị bụ ọrụgkasị Iji bịa n'iru gị i kpọrọ gị isi ala Ọmalịcha, ọmalịcha, ọmalịcha Ọmalịcha bụ ọnwaka ya Ọnwa na kpakpando nwa nnem ọkwa Chukwu kere ha Anyenụ nwanụ mmiri a nwala tobe Chukwu Ụwa na ihe ọma niile dị n'ime ya bụ nke gị Ezi Chukwu gị n'elekọta ya Onye eze Chineke a bịaram be gị Ọmalịcha, ọmalịcha [Chorus] Ugwu na ndịda niile ha nile dị n'ụwa ebubebube Ọnwa na kpakpando nwa nnem ọkwa Chukwu kere ha Anyenụ nwanụ mmiri a nwala tobe Chukwu Ụwa na ihe ọma niile dị n'ime ya bụ nke gị Ezi Chukwu gị n'elekọta ya Onye eze Chineke a bịaram be gị Ọmalịcha, ọmalịcha [Bass Solo 2] Obi naasọ mụọ, obi naasọ mụọ K'anyị jebenu na be Chukwu je rịọ ya mgbaghara K'anyị je gbusikpere ala rịọ wa ya mgbaghara K'anyị je n'iru Chineke ma rịọ wa ya ngozi Na Missa dị nsọ, Chukwu naekpudebegnyị nsọ Ọ naedo kwanyị nsọ Ọ n'enye kwanyị ngozi O Chineke gbadata ị tasị k'anyị na gị nọrịa ai yei ye [Alto & Bass] Chinekeghụ k'anyị n'anya O hurum n'anya [Verse 2] Nwannem biko kam jụkene gị ngozi a niile ọ n'eru kwa gị aka ewo Chinek'ahụ k'a mu n'anya Chinek'ahụ k'anyị n'anya Kedu nke bụ na Chukwu zitere nwa ya K'ọ zọpụta r'anyị n'anjọ Sị onye riri ya g'enwe ndụ Onye hụrụgo jaa ya mma Onye riri oji kpaa ya nku Eh ụmụ Chineke, butenụ ngwa egwu K'anyị tere y'egwu Ngwanụ k'anyị jee Bịanụ, bịanụ tie r'y'egwu dị mma Weta ogene tie r'y'egwu dị mma, kọm kọkọm Butanụ ngwa egwu k'anyị kuoro Chineke tibegwu dị mma Egwu ọma, egwu ọma, egwu ọma, egwu ọma [Solo] Anyị nwere egwu dị mma, egwu anyị ji eto Chukwu Chukwu onye nyer'anyị nzọpụta Chukwu n'egboro m mkpa mụ o Onye nwe ụwa niile Onye ebere, ony'ọma k'ọ bụ Chukwu ebuka, Chukwu ebuka K'anyị jenu na Missa dị asọ, je kọle ya Egwu ọma, egwu ọma, egwu ọma, egwu ọma

Download the sheet music

K'ANYI JEE N'OBI EZE

K'ANYI JEE N'OBI EZE

By Linus Okwu
Solfa
Igbo
5 pages
15 Downloads
Entrance songs Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want