JESU BILITERE N'ONWU by Johnpaul Chukwujekwu Okwor — Lyrics

Johnpaul Chukwujekwu Okwor Igbo Easter Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Onye a kpọgburu n'obe ebilitego Onye a kpọgburu n'obe dike n'agha omerigo, o bilitere n'esie O bilitego, o bilitego n'ike n'ebube ya Ụwa nile kwebe nụ kwe ukwe aṅụrị Onye nzọpụta anyị Jesu bilitere n'ọnwụ eh N'ihi na ọnwụ enwerozi ike n'ebe ọ nọ Jesu bilitere n'ọnwụ n'ezie VERSE 1 Jesu Dinwenụ bịara n'ụwa Taa ahụhụ were nwụọ maka njọ anyị Ọ mechaa bilite n'ọnwụ n'ụbọchị nke atọ ka o siri kwuo VERSE 2 Jesu meriri ọnwụ merie Ekwensu Merie ike ili k'anyị ṅụrịba nụ K'anyị kwebe ukwe aṅụrị N'ihi na ọnwụ enwerozi ike n'ebe ọ nọ VERSE 3 Mbilitere n'ọnwụ Kristi wetara udo N'ime ụwa si na ya nweta nzọpụta K'anyị ṅụrịba makana onye nzọpụta anyị emerigo ọnwụ VERSE 4 Ekele dịrị Chukwu makana Kristi bilitere n'ọnwụ ka o siri kwuo Ụmụnne m k'anyị ṅụrịba nụ n'ihi na Ihe nile nwụrụ anwụ na ndụ anyị Esorola Kristi bilite

Download the sheet music

JESU BILITERE N'ONWU

JESU BILITERE N'ONWU

By Johnpaul Chukwujekwu O...
Solfa
Igbo
2 pages
0 Downloads
Easter Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want