JERUSALEM ULO NDOKWA NO. 1 by Harry Wilson — Lyrics

Harry Wilson Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[JERUSALEM ỤLỌ NDOKWA NO. 1] Jerusalem ụlọ Ndokwa nke bụ sọ anụrị, Ebe anahụ Chukwu anya na ndokwa. Ndụ anyị nọ n'elu ụwa nkea, juru a oke ahụhụ, K'anyị lee anya n'eluigwe bụ obi nke Chukwu. Ihe nile dị na ụwa nkea, bụ ihe nke ga emebi, Ma ihe Chukwu dị n'eluigwe ha ga naadị rịị. Chukwu Onye ji ike nile, na echi eze n'eluigwe, Ndị ọma ncha ga naaṅụrị na otito ebebe. A na arụ ọrụ na ụwa nkea, bụ ọrụ ọpụpịa, A gaanata ụgwọ ọrụ ndịa, n'ala eze nke Chukwu. Ọya, nsogbu, nyana ahụhụ, amaadị na eluigwe, Amaahụlata ọnwụ ncha: ndụ gaadị ebebe. [UKWE LAA MMA] Ndị Nsọ nke Chukwu nyerenụ ya aka, Ndị Mmụọzi nke Chineke zutenụ ya. Naranụ mkpụrụobi ya, duru ya duruo gị n'eze obi Abraham. Ka Kristi onye kpọrọ gị nara gị, Ka ndị Mmụọzi naranụ mkpụrụobi ya, Duru ya duruo gị n'eze obi Abraham. Nye ya ezumike ebighebi Onyenwe anyị, Meekwa k'ihe dị ebighebi chakwasị ya. Duru ya du ga n'ihu nke Onye kasi elu. [A GABA I BURU OZU APỤ N'ỤLỌ ỤKA] Ka ndị mmụọ ozi duba gị na paradise, Ka ndị e gburu maka Chineke zute gị mgbe ị n'abịa, Wee durue gị n'obodo nsọ, Durue gị n'obodo Nsọ ahụ bụ Jerusalem. Kwee otu n'ime ndị a: Enligwe ga bugwo (Ma ọbụ) Jerusalem uno ndokwa.

Download the sheet music

JERUSALEM ULO NDOKWA NO. 1

JERUSALEM ULO NDOKWA NO. 1

By Harry Wilson
Solfa
Igbo
2 pages
8 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want