Full Lyrics
Ada mma ee! Gịnị kam n'anụ?
Ị nụrụ gịnị, gwanụ mo,
Ị nụrụ gịnị gwanụ mo, gịnị kam n'anụ?
Ị makwa, ị hụ n'anya gị,
Ọ nsọ ị hụrụ n'anya dị gị ọma (a ebe k'ịhụrụ ya)?
Ahụrụ m ya ebe ụmụnwanyị n'achụgharị sị yie n'esogharị ya.
Ha na ya n'ụga piom piom piom, piom piom piom,
Makwa ihe mere nụ, (gwanụ m)
Ọ sịrị nụ gọmma g'abụziụ nye ya n'ọ gaghị alụzi gị.
Makwa nke ka njọ (gwanụ m)
Ọ sịkwa ra k'ụwa luwa m, mana m jụrụa jụ...
Kwu nwezio kwu?
Ọ bụduo ihe ahụ mere ịhụnanya m jigbanarị m,
M chọọ ya n'elu ahụghịm ya,
M chọọ ya n'ala ahụghịm ya,
M chọọ ya n'ahịa ahụghịm ya,
N'ime obodo ahụghịm ya.
Chukwu kere ụwa, bịa lere,
Ụmụagbọghọ, chọrọ ịgbu m'ebuo!
REFRAIN
Ewo, gịnị mere ịhụnanya, aa ee!
Akpọrọm ya m'ọ zaghị mo, (ewo!)
Achọsigom ya, mana ahụghịm ya,
Aga m'ebili chọrị hụnanya mu gaghari ụwa.
N'ime obodo kam chọrị hụnanya mo,
Ma n'ime ahịa ahụghị m'ịhụnanya mo,
Chukwu kere ụwa lee, ọ gịnị kam g'eme?
Aga m'ebili chọrị hụnanya m gaghari ụwa.
VERSE 1
Ahụrụ m'ụndị nche ka ha n'agagharị n'obodo
M were jụọ ha ma ha hụrụ ịhụnanya.
Chukwu kere ụwa lee ọ gịnị kam g'eme!
Nyem hụrụ n'anya, lọghachi, lọghachi.
Ezigbo Nnem biko gwam'ihem g'eme.
Lee! nwagi n'ebe akwa,
Ịhụnanya mo ahapụla mo
Nye m hụrụ n'anya anam'eche re gị o.
VERSE 2
Ezigbo adọzọ moo!
Ada mma m buno bibio!
Nwa mar'ezigbo mma, elu gim nnu eriela m'obi mo
M magi zụmọ ke n'enweghi ntụpọ
Ada mma gị ghara oo!
Biko, hapụ ndị asịrị ka ha sị gbaba.
CODA
An'a m'anụ olu gị, nde nde kwuru gede, kwuru gede, nde nde...
O luo nyem hụrụ n'anya
Gee ntị kịnụ
O luo nyem hụrụ n'anya
Lee anya n'ezi
Hụruo nyem hụrụ n'anya
K'ọ guzo n'ezi
Lekwa k'ọ n'abia
Ya buo nyem hụrụ n'anya
Ada mma gịnị kam mere gị?
Ke dui hei jiri hapụ m?
Ke dui hem jiri mọjọ gị?
Ada mma zuru gị uhu
Ad'ọmam hụrụ n'anya
Nwa nwa mam hụrụ n'anya
Bịa zie nụ k'anyi lawa