IHE NDI A DI NJỌ by Harcourt Whyte — Lyrics

Harcourt Whyte Igbo Lenten Hymns Hymns Prayer Sacred songs Staff & Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Olu nke Chukwu n'ada n'ime obi si: "Nwam, ihe ndia di njọ, nwam, ihe ndia di njọ, Ejesola ha, nwam." M'olu nk'ekwensu n'ada n'ime nti si: "Nwam, ihe ndia di mma, nwam, ekwela ha laa, ezi nwam." VERSE 2 Mgb'ayi n'ew'ih'ony'ọzọ Chukwu n'asi: "Nwam, ihe nka di njọ, nwam, ihe nka di njọ, Emekwala ya, nwam." M'onye n'arafu anyi b'ekwensu n'asi: "Nwam, ihe nka di mma, nwam, ọg'emeba gi, ezi nwam." CHORUS "Ihe ndia di njọ," Chukwu n'asi, "Ihe ndia di mma," bu olu nk'ekwensu. M'ọn'ak'anyi utọ inu nk'ekwensu, N'isor'olu ya n'ekwu, n'asi: "Ihe ndia di mma, di mma, di mma, di mma, di mma." VERSE 3 Mg'ayi n'ejekwuru njọ Chukwu n'asi: "Nwam, ihe nka di njọ, nwam, ihe nka di njọ, ejesola ya, nwam." M'ony'iro nke madu bu'ekwensu n'asi: "Nwam, ihe nka di mma, nwam, jisike mee ya, ezi nwam." VERSE 4 Mg'ayi n'ekwutọ'atakwu, Chukwu n'asi: "Nwam, ihe ndia di njọ, nwam, ihe ndia di njọ, ekwukwala nnọọ, nwam." M'onye n'emebi'uwa bu'ekwensu n'asi: "Nwam, ihe ndia di mma, nwam, ha n'ewet'ọṅu, ezi nwam." VERSE 5 N'ime kworo n'ikp'asi, Chukwu n'asi: "Nwam, ihe ndia di njọ, nwam, ihe ndia di njọ, n'ahu kwa n'anya, nwam." M'onye nduhie nk'uwa bu'ekwensu n'asi: "Nwam, ihe nka di mma, nwam, anya lar'anya, ezi nwam."

Download the sheet music

IHE NDI A DI NJỌ

IHE NDI A DI NJỌ

By Harcourt Whyte
Staff & Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Lenten Hymns Hymns Prayer Sacred songs
0 0

More lyrics you may want