Full Lyrics
[REFRAIN]
Enwerennu nnukw'ihe an̄ụrị nke mere na Bethlehem
Otu Nwa k'amụrụ anyị
Onye Nzọpụta taa k'anyi jee leta
K'anyi jee letanu Ya
Otu Nwa k'amụrụ anyị
Nwa ka Nwa
[VERSE ONE]
Na Bethlehem nke dị na Obodo Judea
Ka Meri Onye Chukwu gọziri mụtara Nwa ka Nwa
[VERSE TWO]
Chukwu Nwa si n'igwe bia n'ụwa eh I biala k'anyi jee
Onye Nzọpụta eburu ya n'amụma n'aga amụr'anyi
Otu Nwa Nwoke eh Amụm'emezuwo nụo amụm'emezuwo
Nkwekwer'anyi emezuwonu Onye Nzọpụta biala oh
Mba nile n̄ụrịba k'anyi jee
[VERSE THREE]
Ndi amamịhe si n'ọwụwa anyanwụ
Ha bịar'ileta Nwa amụrụ ọhụrụ
Onyiny'ọlaedo frankinsence
Onyinye myrrh onyiny'an'enye ndieze k'anyi jee
[VERSE FOUR]
Ndi mmụọzi nke'lu igwe n'ekwukw'otito
Otito dịrị Chukwu
Otito dịrị Chukwu
Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu n'ụwa udo
N'ụwa udo udo n'ụwa udo dịrị ndi mmadụ
Ndi'he ha n'asọ Chukwu
N'ụwa uha n'asọ Chukwu k'anyi jee