Full Lyrics
[Male Solo]
Papa, papa, papa, papa eh!
Ị bụ ide ji ụlọ.
Papa eh! Ị bụ ide ji ụlọ.
[Female Solo]
Papa oh! Ị bụ ide ji ụlọ.
E wepu ide, ụlọ gaama jijiji eh, jijiji.
E wepu ide, ị ma n'ụlọ anyị gaada.
Papa, ị bụ ide ji ụlọ.
[Chorus]
Papa ah!
Kọm kọm kọm, ogene n'egbu.
K'anyị gbaba nụ egwu dị mma,
Makana papa bụ ide ji ụlọ.
Torente rento rento.
Ndị ọja n'egbu,
K'anyị gbaba nụ egwu dị mma,
Makana papa bụ ide ji ụlọ.
[Soprano]
E wepu ide, ụlọ a gaghị akwụ.
E wepu ide, ị ma n'ụlọ anyị gaada.
Papa, ị bụ ide ji ụlọ.
Ụlọ gaama jijiji eh, jijiji.
E wepu ide, a ga m anwụ.
E wepu ide, ị ma n'ụlọ anyị gaada.
Papa, ị bụ ide ji ụlọ.
Kọm kọm kọm, ogene n'egbu.
Makana papa bụ ide ji ụlọ.
Torente rento rento.
Ndị ọja n'egbu,
K'anyị gbaba nụ egwu dị mma,
Makana papa bụ ide ji ụlọ.
[Verse]
Nnam n'ata ahụhụ n'ihi mụ o.
Ọ kwa ka m dị mma, ka m baa n'uru n'ụwa.
Papa m anụghị mmanya eh,
Papa m agbaghị akpụkwụ eh,
Papa m elughị ụra n'ụlọ,
K'o weledo nụ m anya.
[Prayer]
Chukwu biko gozie nụ nna mụ o.
Chukwu biko gozie nụ nna mụ o.
Biko nye nụ ya ndụ,
Biko ka ọ dịrị,
K'ọ dịrị m ezi ndụ.
Mụ o bunye ya òkè ya,
Maka ahụhụ nile ọ tara maka mụ o.