OBILIGO! by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Easter Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Hoh! Obi ligo! Eh! Obiligo!! Kristi emerigo ọnwụ O merigo n'ọnwụ! K'anyị ṅụrịbanụ, butenụ egwu ọma, Obiligo n'ọnwụ! Kristi Dinwenanyị n'ezie O merigo n'opi ike; Ik' ekwensu adagọ mba, nmeri Chi m ego. VERSE 1 Na Getsemani Kristi ruru uju Ọsụsọ nmee nile O merigo Okpu ogwu, ụtarị apịara ya, Akpọgbue ya n'obe O merigo. VERSE 2 N'ụtụtụ, mgbe anwụ walụ n'ụbọchị nk'atọ; Ụmụ nwaanyị gara n'ili mana ha ahụghị ya Ha chọrọ Jesu, chọọ ya n'ala, chọọ ya n'ugwu, Oghighara wee dị, akwarịrị Chọọ y'ebe nile mana ha ahụghị ya Ha n'achọ ya mana ha ahụghị ya Ha n'ebe makana ha ahụghị ya VERSE 3 Otu Mmụọzi kwuru n'ụzọ wee sị ha Nụrịbanụ! Kristi Dinwenụ ebiligo! O buru g'ụzọ gaba na Galili Gabanụ ga gw'ụmụazụ ya n'obiligo! VERSE 4 Akanri Chukwu emeriela, Akanri Ya weliela m elu. Aka Chineke dị ebube n'arụ m o Wer'aka Gị, Nna, gọziwe m o! Wer'aka Gị, Nna, buliwe m elu! Ọnwụ olee ike gị? O merigo! Ọnwụ, kedị ke gị o? O merigo! Onye e gburu egbu, lie ya n'ala, wer'okwute kpuchite ya; Olee nmeri gị? O merigo. Alleluia, Alleluia! O merigo. Ike jiej'ọgụ bụ Onyenwe nmeri! O merigo.

Download the sheet music

OBILIGO!

OBILIGO!

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Easter Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want