Full Lyrics
REFRAIN
Hoh! Obi ligo!
Eh! Obiligo!!
Kristi emerigo ọnwụ
O merigo n'ọnwụ!
K'anyị ṅụrịbanụ, butenụ egwu ọma,
Obiligo n'ọnwụ!
Kristi Dinwenanyị n'ezie O merigo n'opi ike;
Ik' ekwensu adagọ mba, nmeri Chi m ego.
VERSE 1
Na Getsemani Kristi ruru uju
Ọsụsọ nmee nile O merigo
Okpu ogwu, ụtarị apịara ya,
Akpọgbue ya n'obe O merigo.
VERSE 2
N'ụtụtụ, mgbe anwụ walụ n'ụbọchị nk'atọ;
Ụmụ nwaanyị gara n'ili mana ha ahụghị ya
Ha chọrọ Jesu, chọọ ya n'ala, chọọ ya n'ugwu,
Oghighara wee dị, akwarịrị
Chọọ y'ebe nile mana ha ahụghị ya
Ha n'achọ ya mana ha ahụghị ya
Ha n'ebe makana ha ahụghị ya
VERSE 3
Otu Mmụọzi kwuru n'ụzọ wee sị ha
Nụrịbanụ! Kristi Dinwenụ ebiligo!
O buru g'ụzọ gaba na Galili
Gabanụ ga gw'ụmụazụ ya n'obiligo!
VERSE 4
Akanri Chukwu emeriela, Akanri Ya weliela m elu.
Aka Chineke dị ebube n'arụ m o
Wer'aka Gị, Nna, gọziwe m o! Wer'aka Gị, Nna, buliwe m elu!
Ọnwụ olee ike gị? O merigo!
Ọnwụ, kedị ke gị o? O merigo!
Onye e gburu egbu, lie ya n'ala, wer'okwute kpuchite ya;
Olee nmeri gị? O merigo.
Alleluia, Alleluia! O merigo.
Ike jiej'ọgụ bụ Onyenwe nmeri! O merigo.