Ezeudo n'Amaudo - a Plea for Peace. by Coxe Chris — Lyrics

Coxe Chris Igbo Folk songs Concert Non-Liturgical / Special Choir Arrangements Solfa notation

Full Lyrics

Nnọọ nụ o, Nnọọ nụ o, g'adịr'ụnụ na mma. Nnọọ nụ o, g'adịr'ụnụ na mma. Ụkwụ agaghị akpọ ụnụ o, anwụ agaghị achagb'ụnụ o, Mmir'agaghị ama ụnụ o, g'adịr'ụnụ na mma. Isi agagh'awụ ụnụ o, agụụ agagh'agụgb'ụnụ o, Ọmụmụ nwa n'akụnụba g'abịar'ụnụ n'uju. Ked'eb'ụnụ n'eje? Ked'eb'ụnụ n'aga? Ked'eb'ụnụ n'eje? Ebe k'ụnụ si abịa? Ked'eb'ụnụ ji mma, ube, ụta eje? Agha ọ dara b'anyị? K'ọt'rị ọbịara b'anyị? K'ụn'anachụkọgị nta? Olee b'ụnụ n'e je Iyelenye. Asịrị n'awọ anaghị agb'ọsọ ehihie na nkịtị, m'ọnwegh'ihe ọ n'achụ, ịmara n'ihe chụrụ y'abịa. Biko gwa nụ m'eb'ụnụ n'eje kam mara maka n'agwagh'onye isi m'r'ir'id' afọnye nwụrụ an'eli. Ọ nwekwar'ike ịb'e akwa onye dị ndụ. Ezeudo pụtakene n'ụzọ anyị n'eje, ịgosi eze anyị ekpebigo n'anyị g'emesị y'ike. Ezeudo pụta kene, pụta pụta. N'iwe new'anyị, n'iwe new'anyị. Biko doo doo, doo biko doo doo, doo biko doo doo, doo biko nụ biko nụ. Amaud'ọb'onye jebe b'Eze ọkpara mma n'aka? Ọb'onye jebe b'Eze kpojuo ụta n'ubu? Ọb'onye jebe b'Eze ọkpar'ube n'aka? Olololo lo! Ntị anụ m'ife. Olololo lo! Ahụziele m anya o. Iwe ụnụ dajụọ, obi ụnụ dere jụụ, nwayọ nwayọ. K'eji arach'ofe dị ọkụ. Ịjir'obi ọkụ mebisie ife. Ịjir'obi ọkụ kụkasịa ife. Ịjir'obi ọkụ emecha ị tab'onwegh'ụta. Makana mmiri gbote e aka fụbanye we n'ọkụ jee menyụ zie. Ọkụ a chọr'ị jit'ofe akp'ọfụma arahụkwa n'ute n'udo biko. Iwe ụnụ dajụọ Iye lenye. Mana kedụzị ka mmiri si wee banye opi ugboghurụ, gịnị bụ isi iwe ụnụ kam mara? Eh! Anyị jer'obi Eze mak'okwu Eze kper'anyị. Eze wee kput'ewu kpunye ya ụmụ amaudo anyị asị: Eze, Eze wer'ewu manye n'ọgbụ, Eze ajụ. Eze wer'ewu manye n'ọgbụ, Ọ fee n'isi. K'anyị masịrị pụba, Eze anyị wee tụgharịa. Wee zi ofu odibo ya, ya wer'ọgbụ manye n'okwihula ka Eze siri wee mejọ anyị. Wee fuo n'obi anyị ekpebigo n'anyị g'emesịrịrị y'ike. Biko nụ doo doo doo, Aye. Biko nụ doo doo doo, Aye. Iwe ụnụ dajụa, biko nụ doo doo doo. Iwe ụnụ dajụa, iwe ụnụ dere.

Download the sheet music

Ezeudo n'Amaudo - a Plea for Peace.

Ezeudo n'Amaudo - a Plea for Peace.

By Coxe Chris
Solfa
Igbo
3 pages
6 Downloads
Folk songs Concert Non-Liturgical / Special Choir Arrangements
0 0

More lyrics you may want